Operation Positive Identification: Gịnị bụ atụmatụ a ndịagha Naịjirịa chọrọ imalite?

Ebe foto si, Getty Images
Ihe na-ewu na soshal midia bụ atụmatụ 'Operation Positive Identification' (OPI) nke ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ga-amalite.
Ọtụtụ kwuru na atụmatụ ahụ bụ ụzọ ndịagha si emekpa ụmụ mmadụ ahụ.
Mana otu ihe doro anya bụ na ọtụtụ amachaghị maka ya bụ atụmatụ.
Gịnị bụ 'OPI'?

Ebe foto si, Twitter/HQNigerianArmy
Ọ bụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Sepụtemba ka ndịagha kwuru na ha amalitela 'Operation Positive Identification'.
N'oge ahụ, ha kwuru na nke a ga-abụ naanị na mpaghara ugwu ebe ndị oyiegwu Boko Haram na-enye nzogbu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ha kọwara na atụmatụ ahụ bụ iji chọpụta ma nwụchie ndị otu Boko Haram na-ezo ezo.
Ha dọkwara aka na ntị ka onye ọbụla bi maọbụ na-eme njem na mpaghara Nọt-Ist jiri akwụkwọ njirimaraonye nke Bekee kpọrọ 'Identity Card' kpagharịwa.
'OPI' ọ ga-agazu Naịjirịa niile?

Ebe foto si, Twitter/HQNigerianArmy
Ndịagha kwuru na atụmatụ 'OPI' ga-agazu Naịjirịa niile.
Ha mara ọkwa a n'akara 'Twitter' ha n'abali iri abụọ na ise nke ọnwa Sepụtemba.
Ụfọdụ ndị mmadụ malitere kesawa ozi ha sị na o si n'aka ndịagha.
Ozi ahụ na-ekwu na 'OPI' ga-agazu Naịjirịa niile.

Ebe foto si, Nigeria Army
Ozi ahụ kwukwara na atụmatụ ahụ ga-amalite n'abalị mbụ nke Nọvemba ruo abalị iri abụọ na atọ nke Disemba.
Mana ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Sagir Musa, gwara BBC na ozi ahụ bụ ụgha.
Ndị omeiwu gbarụrụ ihu maka ya?

Ebe foto si, Twitter/HouseNGR
Ndị ụlọomeiwu nta kpọkuru onyeisiala Muhammadu Buhari ka o gbochie ndịagha imalite atụmatụ a.
N'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị Tuuzde, ụbọchị 29 nke ọnwa Ọktoba 2019, ha kwuru na atụmatụ 'OPI' megidere iwu Naịjirịa.
Ha kwuru na inyocha akwụkwọ njirimara ndị mmadụ abụghị ọrụ dịịrị ndịagha.
Ndị kwadoro okwu ahụ bụ Ndudi Elumelu na Ahmadu Jaha.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia
Ọtụtụ ndị mmadụ akwadoghi atụmatụ 'Operation Positive Identification'.
@segalink kwuru na atụmatụ ahụ adabaghị chaa chaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@adeyanjudeji kwuru na atụmatụ ahụ bụ maka ntuliaka a na-achọ ime na Kogi nakwa Bayelsa steeti.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@AyoBankole kwuru na ndịagha na-achọ iweghara ebe niile na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









