Trump Impeachment:Ihe ga-eme ugbua n'okwu nchutu Trump

President Donald Trump ends a news conference in New York on September 25, 2019

Ebe foto si, Reuters

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo

Nke na-ewu n'Amerịka ugbua bụ atụmatụ nchutu onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump, onye na-ahụsị anya ka ụlọomeiwu nta mba ahụ malitere njem ịchutu ya.

Nancy Pelosi bụ onyeisi ụlọomeiwu nta fooro ntụtụ taa n'okwu ịchutu Trump dịka ọ sị na akaebe arụ ọ sị Trump kpara juru eju.

Mkpa mkpa okwu a n'akpa n'ogige patị na-anọghị n'ọchịchị a kpọro "Democratic Party" kemgbe ọnwa ole ma ole gara aga.

Ebe ndị pati 'Republican' na-agbajọọ ya.

Okwu a tara akpụ maka na ụlọomeiwu abụọ na n'Amerịka (nke ukwu na nke obele) bụ ndị ga-etinye ọnụ n'okwu a ka onwe isi dị na pati abụọ na-achị mba ahụ.

Dịka pati Trump bụ nke a kpọrọ "Republican Party" na Bekee ka nwee ike ma na-achị ụlọomeiwu ukwu, ndị Demokrat na-achị ụlọomeiwu nta.

Ebu ha s Trump kotere

Onyeisiala Trump na Onyeisiala Volodymyr Zelensky nke Ukraine

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na Onyeisiala Volodymyr Zelensky nke Ukraine

Ihe na-ese okwu bụ ebubo na Onyeisiala Trump gwara onyeisiala mba Ukrane bụ Volodymyr Zelensky ka o nyochaa onye bụbụ osote onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden.

Dịka Trump siri kwuo, Biden na nwa ya nwoke aha ya bụ Hunter Biden tinyere aka na nrụrụaka banyere ego mgbe nwa amadị ahu na-arụrụ otu ụlọọrụ na Ukarane ọrụ.

Nke bụ eziokwu bụ na ndị Ukrane mere nyocha maka ebubo a ma sị na onweghi mpụ ha hụrụ.

Nke bụ isi mmiri bụ na iwu Amerịka machiri onyeisiala mba ahụ ị sị ka mba ọzọ mere ya ihe ọma.

Joe Biden no n'ihu ndị na-azọ ọchịchị ị bụ onyeisiala Amerịka n'afọ 2019 dika ndi ajụrụ siri họta

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Joe Biden no n'ihu ndị na-azọ ọchịchị ị bụ onyeisiala Amerịka n'afọ 2019 dika ndi ajụrụ siri họta

Trump na-ekwu na ị sị ndị Ukrane nyocha Biden na nwa ya abughị inyere onwe ya ihe ọma.

Ebe ndị "Democrat" gbara isi akwara sị na Trump dara iwu ụgwọ ya bụ ịchutu ya dịka usoro ha siri kwuo.

Nke mere oji kara njọ, dịka ha siri kwuo, bu na Biden no n'isi ndị chọrọ ịna-apụ Trump ọkwa na ntuliaka 2020.

Ugbua, akuko banyere ọnọdụ Trump ka bụ ihe obi iko n'elu.

Usoro echi achutu onyeisiala n'Amerịka

Ịchụtụ Trump

Dịka ọ dị ugbua, ọ bụrụ na ndị omeiwu kwenyere na o dara iwu, Trump nwereike iso n'ime ndị chịrị Amerịka a chuturu n'ọkwa, nke gụnyere Bill Clinton na Andrew Johnson.