Social Media Regulation: Kedu etu gọọmentị ga-esi chikọta ma hazie Soshal Midịa?

Ebe foto si, PRESS ASSOCIATION
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Gọọmentị Naijiria amaala ọkwa na ọ dị mkpa ka ahazie ma chikọta soshal midia iji kwụsi ịbụsa akụkọ ụgha na ọkwụ ịkpọ asị.
Mana ọtụtu ndị Naijirịa gbarụrụ ihu n'ihi nke a.
Kama enwere ụfọdụ mba hiwere iwu ha ji achịkọta ma na-ahazi Soshal Midịa.
Mba ndị a gụnyere:
Jamanị
Mba Jamanị hiwere iwu nke ha kporọ 'NetzDG' n'afọ 2018 nke gbasatara ụlọọrụ soshal midia niile nwere mmadụ nde abụọ.
Iwu a nyere ikike na ụlọorụ ndị a nwere elekere awa iri abụo na anọ iwepụ ihe ọbụla na-ezighi ezi.
Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ gọọmenti nde Euro iri ise (€50M).
Ebe mmadụ daara ya bụ iwu ga-akwụ nde Euro ise (€5M).
Yuropian Yuniọn

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Yuropian Yuniọn gbagidere ụkwụ imegide ibusa akụko ma ọ bụ ihe onyonyo ndị oyi egwu.
Dịka iwu ahụ sị kwuo, ụlọọrụ ọbụla na-ewepụghị ihe ngosi ma ọ bụ akụkọ oyi egwu n'ime otu awa ewepụtara ya ga-ata ahụhụ.
Ọstrelia

Ebe foto si, Getty Images
Mba Ọstrelia nwere iwu megidere ndị ụlọọrụ soshal midịa niile hapụru akụkọ ma ọ bụ ihe onyonyo gosiri mkpagbụ na ọgbaaghara.
Ọ bụru na ụlọọru ndị a ewepụghị akụko di otu a, ndịisi ụlọorụ ahụ ga-aga nga ihe ruru afọ atọ.
Ụlọorụ dara iwu a ga-akwụ nha ga-eru ọkara pacenti iri n'ime uru ha nwetere n'otu afọ n'ụwa niile.
Rọshịa

Ebe foto si, Getty Images
Mba Rọshịa nwere iwu na ihe niile gbasara ndị mba Rọshịa ụlọọrụ soshal Midịa ndị a jị arụ ọrụ agaghị esi Rọshịa pụo.
Rọshịa na-atụanya itinye iwu yiri nke ndị mba Jamanị.
Chaịna

Ebe foto si, Getty Images
Chaịna machiri Twitter, Google na Whatsapp na obodo ha niile.
Ha ji Sọshal Midịa nke ha bụ Weibo, BAidu na WeChat nọchie ha.
China nwere igwe mmadụ na enyocha soshal mịdịa ịchọpụta akụko na ozi iwu ha megidere.
Kedu ihe ndị Naijirịa nwere ikwu maka nke a

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọkammụta ihe gbasara mgbasa ozi na ịntanetị bụ Kelechi Nwosu kọwapụtara sị:
- Iwu ndị nke anyi nwere ụgbu a ga-ezu ichịkọta Soshal Midia.
- Ka gọomentị were iwu ndị dị adị megharịa ya tinye na Soshal Midịa.
- Iwu ọbụla ekwesighị igbochi ndị mmadụị ikwu okwu maka gọomentị n'ụzọ airi ezi
Lee ihe ndị Naijiria na-ekwu na Twitter
Otutu ndị dịka @Engr_Henry20 anabataghị iwu ga-emegide soshal Midịa, ọ kwuru sị
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: