Anambra doctors give ultimatum: 'O nweghi uru dị n'ịgba abụbụọrụ ndị dọkịta n'Anambra'

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Gọọmentị Anambra Steeti ekwuola na o nweghi uru dị n'isi azụ banyere abụbụọrụ ndị dọkịta steeti ahụ sị ha ga-agba.
Ndị dọkịta ụlọọgwụ Odumegwu Ojukwu dị n'Amaku Awka sị na ha ga-eme nke a n'ime izuụka na-abịa maaọbụrụ na gọọmentị azaghị oku ha kpọrọ ka e bulie ụgwọọnwa ha.
Mana Kọmishịọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Don Adinuba sị na gọọmentị dị na mbụ na-eleba anya n'ihe banyere ụgwọ ọnwa a.
Adinuba sị na gọọmentị hiwere kọmitee nọ ugbua na-eleba okwu a anya kamgbe ọnwa Julaị ndị dọkịta kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara.
Adinuba sị ka ndị dọkịta a nwee ndidi na gọọmentị ga-emezu nkwa ha n'oge na-adịghị anya.
Cheta na ha gbaburu abụbụọrụ nke mbụ ruo mgbe gọvanọ Willie Obiano kwere ha nkwa itinye anya n'inuli ụgwọ ọnwa ha.
Ikpe bụ nke Chineke - Secondus

Ebe foto si, PDP Official Facebook page
Onyeisioche otu PDP bụ Uche Secondus ekwuola na ikpe niile dị n'aka Chineke
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kpebiri na ọ bụ onyeisiala buhari meriri Atiku Abubakar nke PDP ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Chile bụ Sebestian Pinera esepụla aka ile otu United Nation ọbịa n'ọgbakọ ọnọdụ ihueluigwen'ihi ngagharịiwe a na-eme na mba ya.
Ọ sị na ọ bụ nwute ka o ji kagbuo ọgbakọ a kwesiri ịdị n'ọnwa Disemba kama na ime udo n'obodo ya ka dị mkpa.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Reuters
O ga-adịkwa kpọkpọ na mba Ịngland n'abalị a mgbe Chelsea ga-ele Manchester United ọbịa ebe Liverpool ga-anabata Arsenal n'asọmpi Iko Carabao.
Manchester gbara Chelsea ọkpụ anọ chara na nzute ha n'afọ a ebe Liverpool gbara Arsenal ọkpụ atọ asatara otu
Nkeji
Ihe nkiri ga-amasị gị:
Umu Naịjirịa arachaala Ecuador ka ofe ọha

Ebe foto si, Twitter/NFF
Ibrahim Sa'id zara Omekaagụ n'abalị Tuuzde mgbe o nyere goolu atọ nke Naịjirịa ji merie mba Ecuador na asọmpi iko mba ụwa maka ụmọnwoke na-akarịghị afọ iri na asaa.
Mmeri a mere ka Naịjirịa tozuo ịgafe n'agba nke abụọ asọmpi a nke na-aga n'ihu na mba Brazil.
Cheta na ụmụ Naịjrịa ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ merie Họngarị n'asọmpi nke mbu ha gbara.
Naịjirịa bụ ndị nke mbụ n'otu 'B' ebe ha ga-ezute mba Ọstralia n'ụbọchị Fraịde.

Ebe foto si, Twitter/FIFAcom
Aha otu egwu bọọlụ Naịjirịa maka ụmụnwoke akarịghị afọ iri na asaa bụ 'Golden Eaglets.'
Ha eturula ugo na asọmpi a ugboro ise n'oge gara aga.
Gịnị na-akpata ọnwụ ụmụaka?

Amalitela nnyocha pụrụ iche n'Enugwu steeti iji chọpụta ihe na-akpata oke ọnwụ ụmụaka amụrụ ọhụrụ na Naịjirịa.
Nnyocha a ga-enye aka iji mata etu a ga-esi gbaa ya bụ ụzọ owere mgba ka o wee chie.
Ntuliaka na Briten

Ndị omeiwu mba Briten ekwetala na a ga-enwe ntuliaka n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba afọ a ka ndị mmadụ were aka ha họrọ ndị ha chọrọ ka ha nọrọ n'ọchịchị.
Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Boris Johnson kwuru na ntuliaka a ga-enye ya nkwado ọ ga-eji gaa n'ihu ịchọ ụzọ UK ga-eji si na European Union pụọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










