World Cup 2019: Etu Naịjirịa si agbanwe etu esi ahụ bọọlụ ụmụnwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Ịsonye n'egwuregwu iko mbaụwa ụmụnwaanyị karịrị nanị igba bọọlụ n'anya ndị gbara Naịjirịa.
Otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Naịjirịa bụ naanị otu egwuregwu tozuru ịsonye n'asọmpị iko mbaụwa kamgbe afọ 1991 mana ha ka na-agabiga ọtụtụ ihe mgbochi.
Ụfọdụ ndị Naịjirịa anaghị ahụ ịgba bọọlụ dịka aka ọrụ nye ụmụnwaanyị.
Asisat Oshoala dị afọ iri abụọ na anọ kwuru na agwa a gụnyere Afrịka niile.
Mana o kwuru na ha na-agba mbọ ịgbanwe echiche a.
Naịjirịa nweterala pọinti atọ dịka ha na South Korea na Norway gbachara n'egwuregwu mmepe.
Ha na France ga-achịpụ ya taa na mgbede .
Mana agbanyeghị ihe niile a, otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-enwe mmeri.
'Onye chọkwaranụ ilụ nwaanyị na-arụ ọrụ'

Ebe foto si, Getty Images
Egwuregwu bọọlụ n'Afịrịka anaghị ewu ewu etu o si ewu na mba Europe dịka Oshoala si kọwa ma na-ekwusi ike na o nyeghị ọnụ.
"N'Afịrịka, ọtụtụ nne na nna achọghị ka nwa ha gbaa bọọlụ. Ha chọrọ ka ha gaa ụlọ akwụkwọ"
Francisca Ordega dị afọ iri abụọ na ise n'agbara Shanghai Shengli kwuru na ndị Naịjịrịa anaghị esete iko mbaụwa a mana ọ bụrụ nke ụmụnwoke ihe dị iche ga-adị.
Ọtụtụ ndị gbara m okiri na-ekwu na agaghị m alụ dị makana m na-arụ ọrụ.
Agbara m isi akwara na-eme ihe na-enye m obi aṅụrị. Taa emerie m ha
O nwere ihe a ga-agbanwenwu maka agwa a?








