Adegoke Adewuyi: Ụkọchụkwu a na-enyocha maka ịtọrọ onwe ya ebola ya ekwensu

Ebe foto si, Getty Images
Ihe pụtara ọhụrụ maka akụkọ ụkọchukwu a tọrọ onwe ya bụ na o boola ya ekwensu nọrọ onwe ya.
Mgbe akụkọ Adegoke Adewuyi bụ ụkọchukwu n'Ekiti steetị maka etu o si tọrọ onwe ya pụtachara, ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya.
Ndị uweojii nọ na steeti ahụ kwuru na Adewuyi nọ n'ụlọ oriri na nkwarị abalị atọ ma zitere ndị ụlọụka ya ozi ụjọ n'ekwenti na-atọrọ ya.
Asuquo Amba bụ onyeisi ndị uweojii n'Ekiti kwuru na onye ya na Adewuyi so wee mee mpụ a jikwa otu ekwenti ahụ wee zitere ndị ụlọụka ụkọchukwu ahụ na ọ bụ ego ruru nde naira atọ ka ndị tọrọ ya na-ana ka ha wee gbahapụ ya.
Onye ọ bụ ọrụ ya ịdọrọ ego n'ụlọụka ahụ bụ Oyedeji Olajubu boro Adewuyi ebubo na ọ na-eje ewere mbinye adịgboroja ezupu ego n'ọba ụlọụka ahụ dị n'Ekiti state.
Amba kwuru na ya na ndị otu ya anwụchiela Adewuyi na onye otu ya.
Onyeisi ndị Christian Association of Naịjirịa bụ ụkọchukwu Joshua Orikogbe akatọla agwa a ma na-ekwu na ọ bụghị ihe ziri ezi.





