EU EOM Report: Ihe asaa ndị a kwuru gbasara ntuliaka 2019

Umunwanyi na-egosi akwụkwọ ntuliaka ha na Ọka, Anambra Steeti
Nkọwa foto, Umunwanyi na-egosi akwụkwọ ntuliaka ha na Ọka, Anambra Steeti

Ngalaba nlete ntuliaka otu jikọtara mba nilie dị na Yurop akpọrọ European Union (EU) na Bekee hibere adụọla gọmenti Naịjirịa ọdụ ka ha kpachapụ anya ma gbanwee ọtụtụ mperi o riri na ntuliaka nke 2019 ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iwulite ochịchị onyekwuouche ya n'ọdinihu.

Ngalaba a akpọrọ EU Election Observation Mission (EU EOM) bịara leba anya na ntuliaka e mere na Naijiria na Febuwari nakwa Mach 2019 nyere ndụmọdụ a oge ha wepụtara akwụkwọ ozi ha iji gosi ihe ha nyochapụtara oge a na-eme ya bụ ntuliaka.

Ha kwuru na ntuliaka 2019 jupụtara n'ọgbaghara nke ọ bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasịnụ na Naijiria kpatara ya, kwukwaa na ebe ndị ụfọdụ, ndị orụ nchekwa ekweghi ha na ndị ntaakụkọ ndị ọzọ rụọ ọrụ ha otu okwesiri.

Onyeisi ndị uweojii na Anambra biara leta ụlọọrụ ndị INEC a gbara ọkụ n'Awka
Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii na Anambra biara leta ụlọọrụ ndị INEC a gbara ọkụ n'Awka

Ha kwukwara na ngalaba na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naijiria bu INEC kwesoro ka gọọmenti kwadosie ya ike iji mee ka kwudoro onwe ya ma nwee ikike ihazi ntuliaka n'ọdịnihu n'ụzọ kwesiri ekwesi.

Maria Arena bu onye isi ndi otu EU ahụ biara nyochaa ntuliaka 2019 kwuru na mgbanwe ndia kwesiri ka gọọmentị gbaa mbọ mee ha ngwa ngwa tupu oge ntuliaka ọzọ eruo na 2023.

bu onye isi ndi otu EU

Maria Arena, onye isi ndi otu EU EOM na Naijiria na Adamu Mohammed, onye isi ndi uweojii na Naijiria

Ebe foto si, Facebook/EU EOM Nigeria

Nkọwa foto, Maria Arena, onye isi ndi otu EU EOM na Naijiria na Adamu Mohammed, onye isi ndi uweojii na Naijiria

Lee ndụmọdụ asaa ndị EU EOM nyere gọọmentị Naijiria.

1. Ikwadosi INEC ike iji mee ka usoro mkpokọta mpụtara ntuliaka buru nke pụtara ihe nakwa nke ndị ọha obodo ga-atụkwasị obi.

2. Imeputa iwu ga-akwado ụzọ ịme ka mputara ntuliaka bụrụ nke ghe anya oghe nakwa nke na-agaghị ahịa ahụ nnweta.

3. Ikwadosi INEC ike n'usoro ha si eme ihe nakwa usoro mgbasa ozi n'ime onwe ha.

4. I me ka ngalaba na-ahu maka nchekwa oge a na-eme ntuliaka rụọ ọrụ ha otu okwesiri n'ụzọ pụtara ihe na-enweghi onye ọbụla ha gụpụrụ.

5. I me ka ọbụrụ iwu na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga enwe ọnụọgụgụ ụmụnwanyi ha na-ewepụta i so zọọ ọchịchị.

6. I me ka ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka na-ekpebikwa ikpe n'ihe ndị meburu tupu amalite ntuliaka. Nkea ga-egbochi ndị mmadụ ibupu okwu n'ụlọikpe di iche iche n'otu oge.

7. Ị gbanwe usoro e si enye ikike mgbasa ozi i ji mee ka ndị ụlọọrụ ntaakụkọ nwee efe igbasa ozi ha nke ọma ma gosipụta ndịịche nile e nwere na Naijiria.

Maka asisa ihe ndị a EU EOM kwuru, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye gwara BBC na ha ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu mgbe ha natara akwụkwọ nchọpụta ngalaba National Demcratic Institute na International Democratic Institute na ewpụte maka ntuliaka 2019.

"A ga-enye anyị akwụkwọ ndị a taa. Mgbe ahụ ka anyị ga etinye ọnụ n'okwu a, ma chịkọta ya ọnụ."

Akụkọ ga-amasị gị