Zamfara elections: PDP emeriela ntuliaka 2019 na steeti ahụ
Inec ekwela ịnye PDP asambodo na Zamfara

Ebe foto si, Inec
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa bụ Inec akpọpụtala aha PDP dịka ndị meriri ntuliaka niile mere na Zamfra steeti na 2019.
Mahood Yakubu bụ onyeisioche ụlọọrụ ahụ kwụrụ na nkwupute a bụ maka mkpebi ụlọikpe kpebiri na ọ bụ PDP meriri ya bụ ntuliaka na Steeti ahụ.
Cheta na Inec na onwe ha kwuru na ọ bụ pati APC bụ ndị meriri ya bụ ntuliaka.
Nke a pụtara na ọ bụ PDP jizi ọkwa Gọvanọ, Ụlọomeiwu nta na nke ukwu nke steeti ahụ.
Yakubu kwukwara na ya ga-aga n'ihu inye ndị PDP asambodo mmeri na Monde bụ abali iri na abụọ na asaa ọnwa Mee.
Ụlọikpe ukwu kpebiri ụbọchị Fride na ọbụghị APC nwe mmeri na steeti ahụ maka na ntuliaka imeụlọ ha mere ebe ahụ akwụghị ọtọ ma ọlị.
Maka ndị ntọ n'Anambra steeti

Ebe foto si, Getty/AFP
Aka ndị uweojii n'Anambra akpara ndị ntọ atọ yi uwe ndị agha na agbata ụzọ Ekwulobia bụ ebe ha ji otu nwoke aha ya bụ Uchenna Ezeonu.
Ọnụ n'ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Haruna Mohammed gbara ama na-akwụkwọ ọ degaara ndị nta akụkọ taa.
Edoola Ramaphosa n'iyi ọrụ

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, edoola Cyril Ramaphosa n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Saụt Afrịka taa.
Ramaphosa meriri ntuliaka emere n'ọnwa a sị na ya ga ebuso mpụ na ngarị agha pụrụiche n'ọchịchị a.
Lee ndi Super Falcons nke France 2019

Ebe foto si, NFF/Twiitter
N'egwuruegwu, dịka Flying Eagles jị ọkpụ anọ merie ndị Qatar na asompi mba ụwa ndị gbara afọ iri abụọ, NFF ewepụtala aha mmadụ iri abụọ na atọ bụ ndị Super Falcons ndị ga-eso gbaa iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị na France na 2019.
Aha ụmụafọ Igbo iri na ise so na ndị ga-aga ya bụ asọmpi.












