Inec: A kwụsịla ikesa asambodo mmeri na Zamfara

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Inec akwụsịla nkesa asambodo mmeri na Zamfara

Onyeisi Inec

Dịka Inec sị akwado ikesala asambodo mmeri na steeti dị icheiche, Zamfara esoghi na steeti ebe a ga-eke asambodo na Wensde 27 Maachị, afọ 2019.

Legọs gụnyere ebe ndị agaghị enye echi n'ihi na ebufeela ụbọchị a ga-enye asambodo mmeri ruo ụbọchị Fraide 29 Maachị, afọ 2019

Ha kọwara n'akara Twitter ha na ọ bụ iwu ụlọikpe nyere ka ha jiri kwụsị ya bụ emume a kwadoro mbụ.

"Anyị na-eleba anya n'ikpe ụlọikpe nyere gbasara ndị na-azọ ọkwa n'okpuru otu APC" so na nkọwa ha nyere.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Dịka ọ dị ugbua amabeghi mgbe ha ga-emecha nyocha maọbụ kesa ya bụ asambodo ndị mmeri kwesiri ịnweta.

'PDP ohere adịghịrị unu n'ọchịchị a' -Oshiomole

Adams oshiomhole

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Adams oshiomhole onyeisi APC

Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole ekwuola na onweghị ihe ga-eme ka APC nabata PDP na ọchịchị nke agbaa.

Oshiomhole kwuru nke a mgbe ndị pati ha nwere ọgbakọ n'Abuja ụbọchị Monday bụ ebe ha nọkwa kapịa ọnụ maka ndị ha ga-ahọpụta ga-abụ ndị isi ụlọ omeiwu ukwu na nke nta.

Gọvanọ Abubakar ekelela Bala Mohammed maka mmeri ya

Gọvanọ Abubakar nke Bauchi onye ji ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2019

Gọvanọ Abubakar nke Bauchi onye ji ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2019 ebunyela okpokpo ekele ga onye meriri ntuliaka Bauchi steeti bụ Senator Bala Mohammed.

O mere nke a site n'akara Twitter ya:

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Egbuola Nọsụ n'Enugwu

Aka ndị uweojii akparala mmadụ abụọ ana eche na aka ha dị na ogbugbu nwaanyi nọsụ na-arụ ọrụ na Federal Psychiatric Hospital, Enugu.

Maria Amadi na-abanye n'ụlọ ya na Trans Ekulu mgbe ndị omekome ji egbe napụ ya ndị ya n'ike ụbọchị Tọzde gara aga.

Izrel ebusola Hamas agha ọzọ

ogbunigwe
Nkọwa foto, Ọkụ ogbunigwe na Gaza

Izrel amalitela ịtụ ogbunigwe na Gaza strip bụ nke a sị na-ometuru ụlọ onyeisi ndị Hamas.

Izrel sị na ọ bụ Hamas bụ ụzọ tụbata ogbunigwa na Mishmeret nke Izrel. Onyeisi mba Izrel bụ Benjamin Natanyahu dọrọ aka na ntị na ya agaghị anabata ụdị egwuruegwu ahụ.

Nigerian Olympic Eagles

Ebe foto si, NFF/twitter

Nkọwa foto, Nigerian Olympic Eagles

N'egwuruegwu e, Victor Osimhen eturula ugo dịka onye nyere golu atọ na-otu asmopi bụ nke ndi Nigerian Olympic Eagles ji merie ndi Libya n'Asompi iko mba Afrika agbara n'Asaba ụbọchị Monde.

Nigeria ji ọkpụ ano achitaghị aja merie Libya iji gbara isi onwe ha na ọkpụ abụọ Libya gbara ha na-asompi ndị ntorobia nke Afrika.

Nkeji Igbo

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: