Election Tribunal: Gọvanọ ndị nwetara ikike ọchịchị n'aka ụlọikpe

Oshiomhole/Obi/Amaechi

Ebe foto si, @officialAPCng/Rotimi Amaech/Twitter/Getty Images

Akụkọ na-ewu ewu ugbua bụ na Atiku Abubakar nakwa otu PDP azọnyela ụkwụ n'ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala 2019.

N'ime ihe ndị ha rịọrọ ụlọịkpe, ha kwuru ka akagbuo ntuliaka ahụ ma megharịa ya ọzọ.

Ụlọikpe azabeghi ha iji kwu ụbọchị a ga-ebido ikpe a mana anyị chọrọ ịlebanye anya ndị zọtara ọchịchị n'aka ụlọikpe.

Peter Obi.

Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images

Otu ụlọikpe n'Enugwu kagburu mmeri Chris Ngige na ntuliaka emere n'afọ 2003 were nye Peter Obi ikike ọchịchị n'afọ 2006.

O meriri Ngige zọrọ ọkwa n'okpuru PDP ebe ọ zọrọ n'okpuru APGA.

Adams Oshiomhole

Oshiomhole

Ebe foto si, @officialApcNg

Ọ bụ ụlọikpe pụrụiche n'ihe ntuliaka nyere Oshiomhole mmeri n'afọ 2008 mgbe ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru AC.

O meriri Oserheimen Osunbor nke PDP iji zọta ya bụ ọkwa.

Rauf Aregbesola

Rauf Arẹgbẹṣọla

Ebe foto si, Aregbesola

Rauf Aregbesola bụ aka chịbụru Ọsụn steeti zọtara ikike ọchịchị n'afọ 2007 mgbe ọ gara ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka afọ ahụ.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na Olagunsoye Oyinlola kwesiri ịpụ n'ụlọ gọọmentị ebe ọ nọ dịka gọvanọ.

Rotimi Amaechi

Rotimi Amaechi

Ebe foto si, TWITTER/@ChibuikeAmaechi

Okwu Rotimi Amaechi pụrụiche n'ihi na ọ zọghị ọkwa na ntuliaka nke afọ 2007 chacha.

Ebe o si nweta mmeri bụ mgbe ọ gara ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka imeụlọ nke otu ya bụ PDP mere iji họpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa Gọvanọ.

Mmeri ya bụ ihe ịtụ anya diri ndị mmadụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị