Parent and children relationship: Kedu ihe mere nne na nna anaghị ama echiche ụmụ ha?

Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu
Nkọwa foto, Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

BBC Igbo kpọrọ ndị ọbịa pụrụiche ka ha bịa tịnye ọnụ n'okwu gbasra ọdịmma ezinaụlọ.

Anyị nwere mkparịta ụka miri emi maka uru ọbara ime ka enwee ezigbo mmekọrịta n'etiti nne, nna na ụmụaka n'ezinaụlọ.

Pamela Udọka
Nkọwa foto, Pamela Udọka

Ndị bịara mmeme a bụ Steve Obumneke Orajiakụ bụ onye nkuzi na mahadum nakwa onye ntaakụkọ.

Pamela Udọka bụ onye klinika saịkọlọjist bụ ndị na ahụ maka ọdịmma ahụike nke ụbụrụ.

Onyi Syn Osuchukwu bụ onye edemede na intaneti Bekee kpọrọ "blogger".

Ndị a niile tinyere ọnụ n'okwu a dị mkpa ọkachasị ụgbụa ụmụaka na-egbu onwe ha n'ụzọ mmerụala.

Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu
Nkọwa foto, Pamela Udọka, Steve Obum Orajiakụ na Onyi Syn Osuchukwu

Ihe ha kwuru maka mmekọrịta nwoke na nwaanyị

Maka ajụjụ gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị, Obumneke kwuru na ihe niile nwere oge, mana na nwata ruo ihe dịka afọ iri na atọ,

na nne maọbụ nna nwere ike ịgwa ya ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị.

So na mkparịta ụka anyị
Nkọwa foto, Obumneke onye

Onyi Syn sị na ọ bụ nne na nna ka ọ dịrị inyere ụmụ ha aka site n'ịjụ ha ajụjụ gbasara ha.

Pamela kwetakwara na e kwesikwara imalite na nwata kpawara ụmụaka nkata gbasara ahụ ha.

Anyị jụkwara ha mgbe ekwesiri ịnye ụmụaka ekwentị.

Sokwa na mkparịta ụka anyị
Nkọwa foto, Onyi Syn Osuchukwu

Ebe pamela sị na ọ bụ mgbe nwata ruru afọ iri na atọ.

Obumneme sị na ọ bụ mgbe nwata ruru afọ anọ ebe Onyi sị na nna ya nyere ya ekwentị mgbe ya gbara afọ iri na ise iji sị ya deeme ọrụ maka ịgafe ule nke mahadum.

Leezie ihe ha kwuru n'uju ya:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akụkọ ga-amasị gị