Narendra Modi emeriela ntuliaka India

Ebe foto si, Thinkstock
Akụkọ na-afịọ ugbua na-ekwu na Narendra Modi emeriela ntuliaka n'India na-eleghi anya n'azụ.
Nke a pụtara na Modi ga-achị mba India afọ ise ọzọ.
Mpụtara ntuliaka ha mere na-egosi na pati ya bụ Bharatiya Janata Party (BJP) ji ọnọdụ narị atọ (300) n'ime oche narị iri ise, iri anọ na atọ (543) nke mba ahụ.
Iwu kwuru na onye nwetere vootụ narị abụọ na ụma iri abụọ na asaa (272) ga-enwe mmeri na ntuliaka India.

Ebe foto si, AFP
Pati na-arụ ha ụka nke onyeisi ha bụ Rahul Gandhi nke Congress party ekwetebeghị na ya bụ mmeri.
Atụrụ anya na Pati Gandhi ga-erita oche otu narị(100).
Ihe karịrị mmadụ nde narị isii (600 million) tụrụ votu ahụ.








