Tanka bu ndịọrụ mba India efuola na mpaghara Bini

Tanka mmanụ n'elu mmiri

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Egwu dị maka ndị ohiụgbọmmiri nwereike iji ụgbọ Tanka a.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Tanka mmanụ bu ndịọrụ Indịa ruru iri abụọ n'abụọ efuola na mpaghara mmiri a na-akpọ Gulf of Guinea n'ọnụ bekee na mba Bini na ọdịda-anyanwụ Afịrịka.

Anụbeghị olu ụgbọ ahụ edenyere aha na mba Panama kemgbe ụbọchị Tọọsday.

Nke a na-abịa ka akụkọ yiri ya mere n'ihe erughi otu ọnwa n'afọ Jenụwarị ebe ndịohiụgbọmmiri kpụụrụ otu ụgbọ ma hapụkwa ha ebe ndị nwe ya kwụrụ ụgwọ mgbapụta.

Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọmmiri kwuru na ndịagha mmiri mba Bini na-achọ ụgbọ ahụ bu mmanụ ụgbọala ruru puku iri na atọ n'ọnụ ọgụgụ 'tonne'.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara India na mba ndị ọzọ kwuru nke a n'elu igwe okwu Twitter:

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post