Konduga Attack: Ogbunigwe atọ egbuola ihe karịrị mmadụ iri na Borno

Ihe karịrị mmadụ iri anwụọla na Konduga

Ihe karịrị mmadụ iri anwụọla na Konduga, Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Akụkọ si Konduga na Borno steeti sị na ogbunigwe atọ gbara n'abalị Sọnde gburu ihe karịrị mmadụ iri na abụọ.

Onye ntaakụkọ na Borno gwara BBC na ndị ogbunonweya atọ gbagburu ogbunigwe ha n'ezi Konduga ebe ndị na-ekiri egwuregwu nọ na-ekiri ya bụ egwuregwu bọọlụ.

Eserese Konduga na Borno n'ime Naịjirịa

Otu onye ọrụ gbatagbata bụ Usman Kachalla gwara ndị AFP na "Ndị nwụrụ eruola iri atọ. Ihe karịrị mmadụ iri anọ emerụọkwala ahụ."

Atọhapụla mmadụ atọ ndị ntọọ jidere n'Enugwu

Ebere Amarizu
Nkọwa foto, Ebere Amarizu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugu

Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na atọhapụla mmadụ atọ ahụ bụ ndị ejidere ụbọchị Fraịde dịka ha na-eme nchọpụta ebe ya bụ mmiri sị banye n'opi ụgbọghiri.

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi atọọrọla ụmụ agbọghọ atọ bụ ndị si ahịa alọta n'ụzọ Agbani-Ugbụawka dị n'Okpuruọchịchị Nkanụ East dị n'Enugu steeti.

Super Falcons na France ga-asọmpị taa

Super Falcons 2019

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons

Nkọwa foto, Super Falcons 2019

N'egwuruegwu asọmpi iko mbaụwa nke ụmụnwaanyị, Naịjirịa na France ga-akwata ya n'elekere asatọ nke abali ebe Saụt Afrika na Jamani ga-ama ọkaibe n'elekere ise nke mgbede.

China na Spain ga-ezute otu mgbe ahụ ebe Saụt Korea na Norway ga-ezute mgbe Naịjirịa ga-agba nke ha.

Waec sị na-agaghị nyezị asambodo furu efu

Buhari na asambodo ya

Ebe foto si, Bayo Omoboriowo

Nkọwa foto, Oteela ndị mmadụ na-ajụ maka asambodo Buhari

Geenụ nti o, WAEC adọọla ọhanaeze aka na nti sị onye ọbụla jisie asambodo ya ike makana ha agaghị enye ọzọ ma ofuo.

Onye ọrụ Waec bụ , Olu Adenipekun gwara ndị nta akụkọ na ọbụrụ na ọkụ, idemmiri maọbụ ohi zuru asambodo gi, ha nwere ike ịnye gị asambodo mkpanaka.

Ejidele ndị ọrọ gọmenti asị na ha n'ezu ọgwụ

Yoweri Museveni, onyeisiala Uganda Uganda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yoweri Museveni, Onyeisiala mba Uganda

Ụnụ ahụlanoo na nkịta atala ọkpụkpụ anyanere ya n'onu n'Uganda.

BBC African Eye amaala imi n'ala chọpụta ka ndị ọrụ ahụike mba ahụ sị ezu ọgwụ gọmenti eresi ndị ahịa.

Gee nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Nollywood: 'Ekike nwata akwụkwọ m na-eti na-enye m anụrị'

Akụkọ ga-amasị gị