Isaac Promise, ọgba bọọlụ Naịjirịa, alaala mmụọ n'afọ iri atọ na otu

Isaac Promise

Ebe foto si, Twitter/@thenff

Nkọwa foto, Isaac Promise
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ihe anya mmiri emekwaala ọzọ n'egwuregwu bọọlụ Naịjiria.

Isaac Promise, onye gbaara Naịjiria bọọlụ n'oge gara aga, alaala mmụọ.

Otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' kwuputara nke a n'akara 'Twitter' ha na uhuruchi ụbọchị Tọzde.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Promise nwụrụ na mgbede Wenezdee na be ya dị na Austin, Texas nke mba Amerịka.

Akụkọ kọrọ na ọ gharịpụrụ na mberede n'ime ụlọ ebe ọ na-anọ agbatị ọkpụkpụ nke Bekee kpọrọ 'Gym'.

Promise gaara agba afọ iri atọ na abụọ n'abalị abụọ nke ọnwa Disemba afọ a.

Ndị otu Austin Bold FC bụ ebe Promise nọ ugbua ekwuputakwala maka ọnwụ ya.

Tupu ọ gaa Amerịka, Promise gbara bọọlụ ọtụtụ afọ na mba Tọkị ebe ọ gbaara otu dị iche iche.

Ha gunyere Trabzonspor, Karabükspor, Antalyaspor na ndị ọzọ.

Ndị Austin Bold FC ekwuputala maka ọnwụ Isaac Promise

Ebe foto si, Twitter/Austin Bold FC

Nkọwa foto, Ndị Austin Bold FC ekwuputala maka ọnwụ Isaac Promise.

Promise bụ onye ji mgbaaka 'captain' mgbe Naịjiria gara asọmpi bọọlụ nke Beijing Olympics' n'afọ 2008.

Naịjirịa ritere ọla ọcha na ya bụ asọmpi n'afọ ahụ.

E mechara kpọọ Promise n'otu ndị 'Super Eagles' n'afọ 2009.

O so ha gbaa bọọlụ naanị ugboro atọ ma nye otu goolu.

Buhari and Ramaphosa

Ebe foto si, Bashir Ahmad

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa, Muhammadu Buhari na onyeisiala Saụt Afrịka, Cyril Ramaphosa

Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwela nkwa na ya ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji gbochie mwakpo ndị mbịarambịara na mba ahụ.

Ramaphosa kwere nkwa a oge ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nwechara nzute n'ụbọchị Tọzdee.

Mana Ramaphosa kwukwara na ọbụghị naanị ndị Naịjirịa ka a wakporo oge ọgbaaghara 'Xenophobia' dapụtara n'oge gara aga.

Ya bụ ọdachi metụtakwara ọtụtụ ndị mba ọzọ tinyekwara ụfọdụ ndị Saụt Afrịka, dịka Ramaphosa si kwuo.

Na akwụkwọ ozi nke ha zipuru dịka ha nwechara nzute ha, ndịisiala abụọ a kwuru na mmekọrịta Naịjirịa na Saụt Afrịka ka kwụsiri ike.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'aka nke ọzọ, Buhari kelere Ramaphosa maka nnabata ọ nabatara ya.

Ọ katọkwara mwakpo ahụ a wakporo ụmụ Naịjiria n'oge gara aga.

Mana ọ gbarụkwara ihu maka ụlọahịa ndị Saụt Afrịka e mebiri na Naịjirịa iji bọọ ọbọ maka mwakpo 'Xenophobia'.

Mgbọ atụọla ndị Ipob mmadụ abụọ na Saụt Afrịka

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii mba Saụt Afrịka achụsaala ndị otu Ipob bịara ịme ngagharịwi maka Onyeisiala Muhammadu Buhari bịara ebe ahụ.

Otu n'ime ndịisi Ipob n'Abuja bụ Reverend Peace gwara BBC Igbo na mgbọ tụrụ mmadụ abụọ.

Peace kwuru na ọbụ ezigbo mgbọ ka ndị uweojii gbara ha.

Mana ihe onyoonyoo ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri na ọbụ mgbọ rọba ka a gbara na ngagharịiwe ahụ.

Na France

Ndí uweojii mba Fransí

Ebe foto si, AFP/Getty Images

N'ofesi, ndị uweojii na France egbuola otu onye ji mma magbuo mmadụ anọ n'isiụlọọrụ ha dị na Paris.

Nke a na-eme dịka ndị uweojii mba ahụ gbachara abụbụọrụ maka ajọanya ndị mmadụ na-arọ ha nakwa oke mwakpo a na-eme ha.

Ndị okaiwu mba ahụ sị na ha amalitela ịma imi n'ala iji ịmata ebe mmiri sị banye opi ụgbọgụrụ.

Lig ndị Yuropu

Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Na Lig nke Yuropu, ndị Arsenal na Standard Liege ga-ezute ebe Manchester United na AZ Alkmaar ga esumpi na elekere asatọ nke abali a.

Ndị ọzọ ga-akwata taa bụ RZ Pellets WAC na FC Roma, Besiktas na Wolves na ndị ọzọ.

Anya ga-ewetere gi nchịkọta ya mgbe oge ruru.

Ndị omekome n'Imo steeti

Ndị uweojii nwụchiri n'Imo steeti

Ebe foto si, Imo state police command

Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ihe ruru mmadụ iri bụ ndị na-akpa mkpamkpa ọjọọ na steeti ahụ

Ha gunyere ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị na-ere ọgwụ ike, ndị na-egbu mmadụ, ndị na-awakpo nwaanyị nakwa ndị na-atọrọ ụmụaka.

Mmadụ abụọ n'ime ndị anwụchiri bụ ụmụnwaanyị ebe ndị ọzọ bụ ụmụ nwoke.

Ihe anatara ndị omekome

Ebe foto si, Imo Police Command

Nkọwa foto, Ihe anatara ndị omekome
Onyeisi ndị uweojii n'Imo

Ebe foto si, Imo Police command

N'ofesi

Ọkọlọtọ mba Somalia na US

Ebe foto si, AFP

Mba Amerịka agbapeela ụlọ mmekọ ha na mba Somalia bụ nke ha gbachiri kemgbe afọ 1991 mgbe agha dara na mba ahụ.

Amerịka kwuru na ha mere nke a iji kwado ọdịnma ha na ndị Somalia nakwa ịwụlite udo na mpaghara ahụ.

N'egwuregwu,

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Otu egwu bọọlụ Naịjirịa adabala n'ọgbọ dị ọkụ ka ahọpụtara ndi ha ga-ezute n'asọmpị AFCON nke ndị obere.

Eagles ga-ezute Mali Cameroon nakwa mba Ghana n'ọnwa Nọvemba.

Gee nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile