Xenophobic Attack: Mba Saụt Afrịka arịọla Naịjirịa mgbaghara

Jeff Radebe na onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @NigeriaGov/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa arịọla Naịjirịa mgbaghara taa maka okwu Xenophobia.

Jeff Radebe bụ onye nnọchite anya pụrụiche nke Rampaphosa zitere na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere ọgbakọ taa ebe ọ nọ zie ya ozi arịrịọ ahụ.

Ọtụtụ ụmụ Naijiria hapụrụ mba Saụt Afrịka gbala n'ihi ogbugbu a na-egbu ha na mba ahụ.,

Ụfọdụ ka a gbara ngwaahịa maọbụ ụlọọrụ ha ọkụ.

Nke a mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa na Naịjiria were iwe mebie ihe n'ọdọ ahịa Shoprite na PEP bụ ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nwe na Naịjiria.

Mana agbanyegi nke a, ndị ntorobia mba Saut Afrịca sị na ha achọghọzị ndị mbịarambịara ọbụla n'obodo ha.

Ọzọ,

Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu

Ebe foto si, Nigeria Police Force/Twitter

Ndị uweojii n'isiobodo Naịjirịa bụ Abuja akasiela ndị mmadụ obi na ha kwụ chịm ebe ahụ n'okwu gbasara nchekwa.

Ha kwuru nke a n'ihi ụfọdụ akụkọ na-efegharị na ozuzu, ogbugbu mmadụ na ntọ na-arị ibe ya elu n'obodo ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Na mba ofesi

Ndị dọkịta Zimbabawe agbaala abụbụ ọrụ ma mee ngagharị iwe maka ntọrọ atọọrọ onyeisi otu ha bụ Peter Mugombeyi na-edu ha na ngagharị iwe mbụ.

Mana gọọmentị ala agọrọla ụkwụ ha na ntọ nwa amadi ahụ ma nye iwu ka ndị ọrụ nchekwa tinye anya chọta ya.

N'egwuregwu,

David de Gea na Ole Gunnar Solskajaer

Ebe foto si, Getty Images

David de Gea bụ onye oche bọọlụ otu Manchester United ebinyela aka n'akwụkwọ ịnọgide n'otu ahụ rue afọ 2023.

Cheta na de Gea si otu Athletico Madrid banye Man United n'afọ 2011.

Gee nkeji ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo

Aha onyonyo, Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere

Ụmụ Naịjirịa ọzọ ga-esi Saụt Afrịka bata

Hon Abike Dabiri-Erewa na Allen Onyema

Ebe foto si, Nigerians in Diaspora Commission

Nkọwa foto, Chairman /CEO, Nigerians In Diaspora Commission, Hon Abike Dabiri-Erewa

A ga-akpọlata ụmụ Naịjirịa ọzọ ruru narị atọ na iri na itoolu site na mba Saụt Afrịka n'ụbọchị Tuuzde iri na asaa ọnwa Seputemba 2019.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri sị na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-edebanye aha ha maka ịlọta.

Aha onyonyo, Ihe chere ndi si South Africa lọta

N'aka nke ọzọ Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ezipụla ndị ọrụ ya ka ha gaa na mba Afrịka niile ndị mwakpo a metụtara.

Dịka o kwuru n'akara twitter ya, na ndị a ji ozi udo na ịhụnnaya na-aga mba ndị a gụnyere Naịjirịa, Nijee, Ghana, Senegal, Tanzania na Zambia.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Coscharis emepela ụlọ a na-eme osikapa

Osikapa Ebonyi

A sị na akụ ruo ụlọ, ụlọ ama mma. Onyeisi ụlọọrụ Coscharis bụ Cosmas Maduka ehiwela ụlọọrụ na-arụpụta osikapa n'Anambra Steeti.

A na-atụ anya na Gọvanọ Anambra bụ Willie Obiano ga-agbape ụlọorụ a n'oge na-adịghị anya.

N'ofesi

Anwụrụọkụ si n'ọdọ mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Reuters

Ọnụego mmanụ agbịdị arịala elu nke kachasị ibe n'ime ọnwa anọ site na ogbunigwe a gbara n'ụlọọrụ mmanụ agbidi mba Saụdi Arebia n'ụbọchị Satọde.

Dịka ọ dị ugbua, Saụdi Arebia akọwabeghị nke ọma etu mwakpo a si mee mana ha kwuru na onweghi onye merụrụ ahụ.

N'egwuregwu

Abraham onye otu Chelsea nyere goolu atọ

Ebe foto si, Getty Images

Onye na-agbara Chelsea bọọlụ bụ Tammy Abraham sị na ohere dịrị ya ịgbara Naịjirịa bọọlụ ma ọ bụrụ na a kpọtụrụ ya

A mụrụ Tammy Abraham na Ịngland mana o tozuru ịgbara Super Eagles bọọlụ maka nna ya bụ nwafọ Naịjirịa.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile