Drug Trafficking: Ndị 'Customs' ejichiela anwụrụ ike ruru nde kwuru nde naịra si Ghana abata Naịjiria

Ngalaba na-ahụ maka ntụbata ahịa na Naịjirịa a kpọrọ 'Nigeria Customs Service' ejichiela anwụrụ ike ọnụahịa ya ruru nde kwuru nde naịra.
Zhulkiflu Abdullahi bu onye isi ngalaba 'Customs' na Steeti Oyo na Osun gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchị Wenezde.
Abdullahi kwuru na ọ bụ Ghana ka ndị ekperima si buru anwụrụ ike ahụ na-ebubata Naịjiria.
N'okwu ya: "Ndị ekperima a achọghị izu ike, n'agbanyeghi na e mechiela oke ala Naijiria na mba ndị ọzọ."
"Ya mere, anyi agaghị ezu ike iji hụ na anyị nwụchiri ha niile."

Ebe foto si, Chukwunaeme Obiejesi
Abdullahi kọwara na ọnụahịa anwụrụ ike ahụ ha jichiri ga-akarị otu narị nde naịra na nde naịra iri isii.
Dịka e si kechie anwụrụ ahụ, otu ngwugwu ga-akarị otu nari puku naịra na puku naịra iri ise.
Abdullahi kwukwara na ọ bụrụ na anwụrụ ike ahụ bara n'ime obodo, ihe ọ ga-emebi na ndụ ndị ntorobịa buru ibu.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa niile amụrụla anya ka azụ iji hụ na ha chekwara Naịjiria nke ọma.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









