Ndị uweojii: Anyị na-achọ dọkịta pịara nọọsụ ihe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nọ na Legọs ekwuola na ha na achọ Dọkịta tiri nọọsụ ihe n'ụlọọgwụ, Awoyaya Hospital,dị n' Ibeju Lekki, Legọs.
Akụkọ kwuru na otu dọkịta na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ Dkta Emmanuel Okolo pịara nọọsụ Dorcas Adeyera ihe maka nghọtaghie dapụtara na ịnabata onye nwere mberede okporoụzọ e butere n'ụlọgwụ ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Oti kwuru na ha "na-achọ" nwa amadị ahụ.
Adeyera boro Dkta Okolo ebubo na ọ sekpubere ya ala, maa ya ụra ugboro ugboro ma pịakwa ya mgbadoukwu(belt) n'ihi na ọ nabatara onye nwere ihe mberede okporoụzọ na anataghị ikike n'aka ya.
Nọọsụ ahụ nke degara onyeisi ụlọgwu ahụ ozi mkpesa, gakwara kpesa ya n'ogige ndị uweojii.
Ka ọ dị ugbua, mbọ BBC gbara inweta ọnụ okwu dọkịta ahụ amịtabeghị mkpụrụ oge anyị dere anyị bipụtara akụkọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Anyị ga-ewetara ụnụ akụkọ ka o si aga.





