PPRO Legọs: Etu e si nwuchie nwoke gburu nwunye ya maka ekworo
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ SP Chike Oti kọwara ka aka siri kpara nwoke ahụ a na-ebo ebubo na ọ sụgburu nwunye ya n'Oshodi na nsonso a.
Oti nyekwara ndị na-alụ di na nwunye ndụmọdụ otu ha ga-esi gbalahụ udị nsogbu a nke esemokwu nwere ike ibute.