Nwoke egbuola nwunye ya maka ekworo

Otu ojiegoachụego a kpọrọ Tochukwu Chukwu, onye Uli na Anambara Steeti, egbuola nwunye ya n' Oshodi, Legos maka ebubo ịgba n'ilo.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti gwara onye ntaakụkọ BBC na aka kpara nwa amadị ahụ oge ọ gara ịtụfu ozu nwaanyị a nke ọ sụnyere na bọket n'ụzọ ụtụtụ.
Oge ndị agbataobi jụrụ ya ihe o bu n'isi ma o nweghị ezi nkọwa o nyere ha, mere ka ha manye ya ka o mepe ya.
Ha were hụ ozu nwaanyi o jiri akwa gbuchie ma kụwa ya ihe mecha were ya nyefe ndị uweojii.
Oti kọwara na nchọpụta nke onyeisi uweojii nke ogige ndị uweojii, Akinpelu Police Station kwuru merela na-egosi na ọ bụ nsogbu ezinaụlọ.
Okwukwara na ndị uweojii jichiri nwoke ahụ ganye na ha mechaa nyocha zuru oke, ebe ka tinyekwara ozu nwunye ya n'ụlọozu maka nchọpụta.

Ndị mara nwoke ahụ ebe ọ na-azụ ahịa n'ahịa Ladipo dịkwa na Legos, kwuru na ọ bụ ekworo mere nwoke jiri gbuo nwunye ya.
Otu onye a chọghị ka a kpọ aha ya kwara BBC na nwoke ahụ bụ onye gabuola mkpọrọ afọ ise ma bụrụkwa onye na-aṅụ anwụrụike.
Akụkọ kọro na nwoke ahụ gara njem ma kpọ nwunye ya na ekwenti, olu nwoke azaa ya nke mere ka ya na ya lụwa ọgụ.
Akụkọ ga-amasị gị:








