Innoson ekwuola na ọ bụ mmbebọ ka ụlọikpe chọrọ ime ya

Ebe foto si, @innosenmotors
Onyeisi ụlọọrụ Innoson bụ Innocent Chukwuma asaala mkpebi ụlọikpe nyere ka edenye ka onye a na-achọ achọ na Naịjiria were sị na ịkpọ ya onye a na-achọ achọ bụ ụzọ ha si achọ imebọ ya.
Chukwuma, bụ onye ejiri Innoson mara kwuru na ụjọ anaghị atụ ya ị ga ụlọikpe, kama na ekwesịrị ịkpụpụta ya n'ụzọ ziri ezi.
Cheta na ndị ụlọikpe kpọrọ ya onye a na-achọ achọ makana ọ pụtaghị n'ụlọikpe ugboro ise ịza ajụjụ gbasara ebubo mpụ na aghụghọ ndị EFCC na-ebo ya.
N'ime akwụkwọ Chukwuma dere ụnyaahụ, o kwuru na ụlọikpe nke Lagos kwesiri ịkọwa ihe mere ọ ga-abụ ebe ahụ ka a ga-elebanye anya n'ikpe a?
O kwuru na ya edeela akwụkwọ gbasara okwu a n'ụlọikpe nke etiti na Lagos, na kwa ụlọikpe nke etiti ka-elebanye anya na ihe a o dere.
Innoson jụrụ ihe mere ikpe ya ka jiri dị n'aka okaikpe Mojosola Dada ka na-eleba.
Gịnị bụ ebubo a?
EFCC kwuru na Innoson ji n'aghụghọ na ụzọ n'akwụghị ọtọ wee nara ngwọọrụ e ji arụ ọgba tum tum, na ihe ndị ọzọ e ji arụ ụgbọ site n'aka Mitsui OSK dị n'Apapa Legos.
Innoson ka na-agọ ebubo a niile, na kwa kwuo na ya na-ekpesa ikpe a.










