Nigerian Cybercrime: Ebu i nwereike ikotere onwe gị na soshal midia

Ebe foto si, Getty Images
A na-asị na mmadụ nwere ikike ikwupụta uche na onweghi ihe ga-eme ya mana ọ bụghị mgbe onye ahụ kwuru nke dị njọọ.
Ọ bụ eziokwu na soshal Midia enyela ndị mmadụ ohere ị nọ n'ime ụlọ ha dee ihe ọbụla mgbe masịrị ha mana ụfọdụ chefuo na "onweghi ihe zoro ezo n'okpuru anyanwụ".
Ihe mmadụ dere na soshal midia nwereike ibutere onye ahụ ọdachị dịka ịkwụ ụgwọ nha, ịga mkpọrọ nakwa ọnwụ dgz.
N'iji maa atụ, ndị Amerịka jụrụ inye otu nwata akụkwọ Lebanon ikike ịbanye na mba ha maka ihe 'ọjọọ' enyi na dere n'akara Facebook.
Iwu ịntanet na Naịjirịa na ntaramahụhụ ha

Ebe foto si, Getty Images
A bịa na Naịjirịa, onwere iwu na-echekwa ihe ọbụla mmadụ na-eme n'ịntanet, ọ bụrụ na ị daa iwu ndị a, ntaram ahụhụ ga-adịrị gị.
- Ịbanye n'akara Ịnternet onye ọzọ (Hacking): Onye ọbụla mịbara n'akara ịntanet onye ọzọ n'ụzọ iwu na-akwadoghi ga-akwụ oge dị nde naịra 10 ma ọ bụ gaa mkpọrọ afọ ise.
- Izu njirimara mmadụ (Identity theft): Onye ọbụla zuru aha mmadụ n'ịntanet ga-akwụ ego ruru nde naịra 7, gaa mkpọrọ afọ atọ, ike kwe ya ọ gaa kpọrọ kwụkwa ụgwọ.
- Igosi ụmụaka ihe onyonyo ndị gbaọtọ(Child pornography): onye mere nke a ga-aga mkpọrọ afọ iri ma ọ bụ kwụọ ego ruru nde naịra 20 ma ọ bụ mee ha abụọ.
- Inyocha mmadụ n'ịntanet (Cyber-stalking): Ọ bụrụ na ị na-enyocha ihe mmadụ na-eme n'ịtanet n'ụzọ adịghị mma, ị ga-aga mkpọrọ ruru otu afọ rue afọ iri ma ọ bụ ego dị nde naịra abụọ rue nde naịra 20.
- Izuru ngwaahịa mmadụ (Cybersquatting): Onye ọ bụla hiwere ịntanet maka iji zuru ihe onye ọzọ ga-aga mkpọrọ afọ abụọ ma ọ bụ kwụọ ụgwọ wgo dị nde naịra 5.
- Ịkpaoke agbụrụ (Racist/Xenophobic material): Onye ọbụla ji akara ịntanet dịka Facebook na Twitter dee ihe nwereike ibute ịkpaoke n'agbụrụ, okpukperechi, agwa dgz ga-aga mkpọrọ afọ ise ma ọ bụ kwụọ ụgwọ ego ruru nde naịra 10.
- Ime mpụ ịntanet megide gọọmentị: Onye ọbụla zuru ụlọorụ gọọmentị ohi site n'ịntanet ga-eji isi ya kwụọ ụgwọ nke bụ ọnwụ (Death penalty).
Nke a mere na onye na-eme ihe ọbụla n'ịntanet marakwa na "ụkwụ na-aga wara wara, na anya na-ele zam zam na-ahụ ya."
Ihe onye iwu Cyber Crime nwụchịrị gwara BBC Igbo
Akụkọ ga-amasị gị:






