Buhari in Japan: Anyị gara Japan maka ihe dị mkpa, ọ bụghị maka Ipob - Gọọmentị Naịjirịa

Ebe foto si, Femi Adesina
Femi Adesina bụ otu n'ime ndị enyemaka Onyeisila Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari agwaala ndị ntaakụkọ na ihe ha gara ime na mba Japan bụ ihe dị mkpa.
Ọ sị "Anyị enweghi ohere Ipob" mgbe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ.
Cheta na Nnamdị Kanu nyere ndi otu Indeginous Peoples of Biafra (Ipob) iwu ka ha nwụchie Onyeisiala Buhari - bụ onye ha si bụ Jubril nke Sudan - ma ha hụ ya na Japan.
Maazị Adesina gara n'ihu kwuo na o ka mma ịkwụsi ikwu maka "otu a nọ n'ọchịchịrị."
"Ndị gara ebe onye na-anọchịte anya Naịjirịa na Japan na Tokyo ga kparịa nna ha. Ya bụ ihe bụ ihere ruru onye ọbụla ma ihe na Naịjirịa."
Nnamdi Kanu na onye na-ekwe nkwa na ya ga-egosi ihe ọ si ga-agba ama na ọbụghị Onyeisiala Buhari no na Yokohama n'ehihe taa.
Ọ bụ n'akara Twitter ya ka o tinyere okwu a.
Onye ọzọ na-ekwuru Onyeisiala Buhari bụ Bashir Ahmad tinyere ihe nkiri ebe Buahri na-ekwu okwu na Japan.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Odozi Akụ Temie Giwa-Tubosun dekwara na Twitter na ya nọ ebe Buhari na-agụ ozi ya na Japan.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Dika akụko si a ga, Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadụ Buhari ekwuola na ọ bụ mkpụrụ mmadụ ole na ole ụmụ Naijiria nọ na mba ofesi na-enye Naijirịa ajọ aha .
Buhari onyekwuru nke a na nzụkọ ya na ndị Naijiria bi na Japan nwere ụbochi Tụzde si na Naijiria agaghi anabata mpu ma ọ bụ kwere ka ndi omekome nye Naịjirịa aha ọjọọ .
Aka akparala nwoke asi gburu nne ya

Ebe foto si, Getty Images
Aka ndị uweojii Anambra Steeti akparala onye ụkọchukwu a na-eche na o ji mma sụgbuo nne ya n'ụbọchị Tuuzde abalị iri abụọ na asaa ọnwa Ọgọọst, 2019.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed sị na a nwụchiri nwoke ụnyaahgụ ụbọchị 28 Ọgọst, 2019, a ebe o zoro n'Onicha.
O kwuru na ọ bụ site na kepukepu ha nụrụ ka ndị uweojii ngalaba Ọnicha na Orifite ji nwụchie nwoke a kpọrọ Nwabueze Anaka onye ụkọchukwu.
Mohammed sị na ahụrụ mma n'ime akpa nwoke a bu nke e che na o ji gbuo nne ya bụ Grace Anaka.
Ọ gara n'ihu kwuo na e nyefela ya n'aka ndị uweojii ngalaba State Criminal Investigation (CID) ugbua.
Nzuko Buhari, Ramaphosa na Talon
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Onyeisiala Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa na ogbo ya nke Benin Republic bụ Patrice Talon zutere onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọgbakọ a na-eme na Japan.
Ramaphosa kwuru na gọọmentị ya na-ewe iwu n'ogbugbu a na-egbu ndị Naịjirịa na Saụt Afrịka, ebe Talon rịọrọ Buhari ka ọ gbaape okeala Naịjirịa na Benin Republic e mechiri emechi.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Mba Briten ekwuola na ụgbọ agha mmiri ga-ebido soro ndị nke ECOWAS eme ngagharị nchekwa na osimiri oke Ọdịda Anyanwu Afrịka.
Ọ bụ onyeagha nke Briten Mark Lancaster kwuru nkea na Ghana maka ikwusi mkpmkpa ndị omekome na ezu ohi oke mmiri na ndị na ere azu na mmanu agbidi n'ụzọ na ezighịezi.

Ebe foto si, AFP
Mkpebi ndị isi mba Briten ịkwụsịtụ ndị ụlọomeiwu ha ọrụ ebutela oke nsogbu na ngagharịiwe n'ọtụtụ ebe na mba ahụ.
Mana gọọmentị sị na nkwụsị n'ọrụ a ga-ewe ọnwa abụọ bụ maka iji nye ha ohere ịrụrịtaụka banyere ọpụpụ Brexit.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye egwuregwu Lawn Tennis bụ Serena Williams gosikwara na agadị nwanyi anaghị aka nka n'egwu ọ mara agba dịka o meriri Caty Mcnally gbara afọ iri na asaa na agba nke anọ nke US open.
Williams onye meriri iko nke US open tupu amụo Mcnally n'afọ 1999 ga-ezute Karolina Muchova nke Czech ma ọbụ Hsieh su-wei nke Taiwan na-agba nke atọ na asọmpi a.
N'egwu bọolụ

Ebe foto si, Getty Images
Alex Iwobi nyere goolu mbụ dịka onye na-agbara Everton bọọlụ dịka ha ji ọkpụ goolu anọ asatara abụọ mere Lincoln City n'asọmpi Iko Carabou.
Nkeji










