European Union agbatịala okwu Brexit ruo ọnwa Jenụwarị 2020

Otu United Nation

Ebe foto si, AFP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu 'European Union' agbatịala oge ọpụpụ Brexit ruo ụbọchị 31 Jenụwarị afọ 2020 dịka ozi si n'akara twitter onyeisi ha si kwuo.

Onyeisi 'European Council' bụ Donald Tusk sị na nke a ga-enye ohere ka ndị mba Briten nwee ike pụọ ma ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu ha tinye aka na ya.

Nke a na-abịa dịka ndị ụlọomeiwu chọrọ ime mkpebi maka ntuliaka ọsịsọ onye praịm mịnịsta ha bụ Boris Johnson chọrọ ka e mee n'ọnwa Disemba 12.

Buhari ga-anọ izu atọ na Lọndọn

Ị nụla na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-esi mba Saudi Arebia ebe ọ gara maka nzukọ gbasara ọdịniihu achụmnta ego zọpụ ije garuo London ebe ọ ga-anọ njem ezumiike site n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri na asaa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

"Obi amapụla unu!"

Ụkọ mmiri Saụt Afrịka

Ebe foto si, AFP

"Werenu mmiri naanị maka ọṅụṅụ na isi nri, mana obi amapụla unu maka ụkọ mmiri na-akọnụ!" ihe a ka ndị ụlọọrụ na-arụ ebe ọdọ mmiri kachasị ukwu na mba Saụt Afrịka na-agwa ndị mba ha.

Nke a na-abịa dịka ma mmiri ozuzo ma nke na-agba na pọmpụ na-akọ n'ime mpaghara atọ n'ime itoolu nọ na mba ahụ.

Nke na-eme n'egwuregwu

Aka na-achịkọta Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na ahụ onye egwu ya bụ Mohamed Salah merụrụ abụchaghị ụdịrị nke ga-egbochi ya ịgbara ha bọolụ nsonso a.

Klopp na Salah

Ebe foto si, Getty Images

Klopp kwuru na mwepụ ewepụrụ ya n'ụbọchi Sọnde bụ ka nkwonkwo ụkwụ ya zuo ike.

Ihe chabara n'anya n'AMAA Awards 2019

sobowale

Ebe foto si, Solasobowale/instagram

Ndị niile na-eme ihe nkiri n'Afrịka zukọrọ na Legọs Naịjirịa na 27 Ọktoba 2019, n'emume nturuugo ihe nkiri n'Afrịka akpọrọ AMAA Award 2019.

Nke a bụ afọ iri na ise a malitere emume a ebe ndị ome nkiri dịka Kemi Lala Akindoju, Lorenzo Menakaya na comedian, Funnybone bụ ndị chịkọtara ya.

N'emume a ihe nkiri a kpọrọ 'King of Boys' turuugo dịka ọkachamma na Naịjirịa.

Ebe Adesua Etomi bụ nwunye Banky W turuugo dịka ọkacha eme ihe nkiri n'ihenkeiri ahụ.

Ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru;

Etu o si gaa n'AMAA 2019;

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye a kpọrọ The Prodigy sị na ọgọdọ Denrele sụ dị egwu;

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Buhari ga-aga Riyadh Saudi Arabia

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-azọpụ njem taa gawa n'obodo Riyadh nke Saudi Arabia maka ọgbakọ achụntaego a kpọrọ Future Investment Initiative nke ugboro atọ.

Ọgbakọ a bụ nke ndị ụlọọrụ na-ahụ maka achụntaego na Saudi Arabia na-ahazi ga-agbakwasị ụkwụ na mmepe Teknụzụ maka ọdịmma obodo.

Nke a na-abịa n'ime ụbọchị ole na ole ọ ka si mba Rọshịa lọta bụ ebe o zutere onyeisiala ha Vladimir Putin.

Miyetti Allah asịghị na ha gburu ndị mmadụ na Benue

Allen Onyema, Saleh Alhassan, Sammuel Ortom

Ebe foto si, @benuestategovt

Allen onyema bụ onyeisi otu 'Ethnic Harmony' na Naịjirịa ma bụrụkwa onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu Airpeace ekwuola na Miyetti Allah asịghị na aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ na Benue Steeti.

Ọ sị na ndị mmadụ ghọtaghere ihe odeakwụkwọ ndị Miyetti Allah kwuru, na o nweghi mgbe otu a sị na ọ bụ ha gburu ndị mmadụ.

Cheta na Onyema kpere udo n'etiti Miyetti Allah na gọọmentị Benue Steeti n'ụbọchị Satọde.

N'ofesi

Alberto Fernandez

Ebe foto si, Reuters

Mba Ajentina ahọpụtala Alberto Fernandez dịka onyeisiala ha n'agbanyeghi ọnọdụ ojọọ akụnaụba ha nke dosara ọtụtụ mmadụ n'ụbịam.

Fernandez ji vootu pasentị iri anọ na ise bụ nke karịrị vootu ole a chọrọ merie Mauricio Macri bụ onye nọ n'ọchịchị.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile