Nritu Boris Johnson ebulitela okwu 'Brexit' elu

Ebe foto si, AFP
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Boris Johnson arituola n'ọkwa dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na ndị ọzọ nke Bekee kpọrọ 'foreign' Secretary'.
Akụkọ kwuru na Johnson rituru ka e nwechara arụmụka gbasara atụmatụ mba Briten ga-esi mee 'Brexit'.
Ọpụpụ Johnson mere ka ọ bụrụ onye na-arụ n'obi ọchịchị minista nke abụọ ga-aritu n'ọkwa n'ime awa 24, ka David Davis bụ odekwụkwọ Brexit rituru.
Nritu ya na-abịa naanị nkeji 30 tupu Praịm Minista bụ Theresa May ekwuputa atụmatụ ọhụrụ o nwere gbasara Brexit na 'Parliament'.
N'akwụkwọ ozi, gọọmentị kelere Johnson maka ọrụ ya, ma kwuo na a ga-ekwuputa onye ga-anọchi ya n'oge na-adịghị anya.




