Women's Protest: Gịnị ka ọ pụtara ma ụmụnwaanyị gbara ọtọ mee ngagharịiwe

Ụmụnwaanyị ịgba ọtọ mee ngagharịiwe
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị mere ngagharịiwe n'ogige ụlọikpe n'Abuja mgbe e mere ikpe Nnamdi Kanu.

Ụfọdụ ụmụ nwaanyi Igbo yipuru akwa elu ha tukwuru n'ala nkịtị ma na-ekpe ekpere ma na-agụkwa egwu n'ogige ụlọikpe nke dị n'Abuja bụ isi Oboido Naijirịa n'ụbọchị Wenesde dịka a na-ekpe ikpe onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Dịka omenala ndị Igbo na ụfọdụ mba ndị ọzọ siri dị, ọ bụghị ezigbo ihe nwaanyi iyipụ uwe ha n'ọha.

Kama nke a abụghị mbụ ụmụnwaanyị megoro ụdịrị ihe a.

Ụmụnwaanyị na agbakarị ọtọ eme ngagharịiwe iji chọọ ikike diiri ha maọbụ maka ọdịmma nke ndị obodo.

Cheta na n'ọnwa Mee nke afọ 2017, na ụmụ nwaanyị Igbo ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) yipuru uwe ha mee ngagharịiwe n'Abiriba, Abia steeti maka agwa ndị agha Naịjirịa kpasoro ha.

Nke a mere BBC Igbo jiri tinye anya na ya bụ ihe iji chọpụta ihe kpatara ụmụnwaanyị ji emekarị ya bụ ihe mgbe ụfọdụ.

Ụmụnwaanyị ịgba ọtọ mee ngagharịiwe

Onye ọka mmụta na ihe gbasara akụkọ agbaochie na West Virgina University bụ Bright Alozie sị na ya chọpụtara na ọ bụghị naanị Ụmụnwaanyị Igbo na-eme etu a.

Ọ sịkwa na ụmụnwaanyị agbụrụ ọzọ na Naịjriịa jikwa ya bụ agwa azọ isi onwe ha ma ihe siwa ike.

Edemede ya kwuru na nsonso a, n'ọnwa Julai afọ 2020, na ụmụ nwaanyị ndị ọdịda anyanwụ Kaduna yipuru uwe elu ha, na-agwọ onwe ha n'ala iji gosi iwe ha maka mmegbu na ogbugbu ndị mmadụ na-eme n'ebe ahụ.

Alozie dekwara na ụmụnwaanyị ndị Yoruba na ndị Igbo jikwa ya bụ agwa eme ihe siri ike ma oge ruo.

O kwuru na "ọnwebeghị mgbe ụmụnwaanyị mere otu a ka ha ghara izọta ihe ha na-azọ".

Ọ sị na kama igosi ihere, ụmụnwaanyị ji ọtọ ha egosi iwe ha, ike ha ma mee ka anụ olu ha.

Ụmụnwaanyị ịgba ọtọ mee ngagharịiwe

Akụkọ na-echetakwa maka ngagharịiwe ụmụnwaanyị n'Aba, Owerri na Calabar, nke ụmụnwaanyị ji sị ndị ọcha ọchịchị nchịgbu na o zuola n'afọ 1929.

Ụmụnwaanyị a gba ọtọ were mee ngaghrịiwe a.

Ụmụnwaanyị iri ise nwụrụ na ya bụ ngagharịiwe.

Ọzọ kwa, n'ime afọ 1930 ụmụnwaanyị Abeokuta busoro Alake Abeokuta agha nke mere ka ọ gba ọsọ ndụ ya maka ihe ọ mere ha.

Chetakwa n'afọ 2002 ụmụ nwaanyị ndị Niger Delta karịrị 600 n'ọgụgụ gba ọtọ mee ngagharịiwe maka na ha sị na Chevron na Texaco na-emetọrọ ha mmiri na ala ha ma ghara ilenyere ha anya.

Ụmụnwoke ha emeela ike ha mgbe ahụ ma ọnweghị ihe ha metere.

Nze Duruagwu Ukaejuoha
Nkọwa foto, Duke Ukaeje, Duruagwụ nke abụọ sị na nwaanyị ịyipu uwe ya mee ngagharịiwe bụ ihe siri ike na-egosi ala adịghị mma.

Duke Ukaeje, Duruagwụ nke abụọ sị na ọ bụ oke arụ nwaanyị ịgba ọtọ na-ezi iji gosi iwe.

Ọ sị na "nwaanyị gbara ọtọ kpere gị ekpere maka ajọ ihe ị mere ya, ọtụtụ mgbe, ọfọ ọ gọọrọ onye ahụ ga-ere n'isi onye ahụ".

Ụmụnwaanyị ịgba ọtọ mee ngagharịiwe

Ochie dike bụ Mbazulike Amaechi sị na "nwaanyị gbaa ọtọ na-ezi maka iwe, mara na-arụ mere. Ọ bụrụ ebe ndị okenye nọ, ha agbakeriwe ala mara ka aga e si kpụọla arụ".

Mbazulike Amaechi

Ọ sị na ụmụnwaanyị gbara ọtọ n'ogige ụlọikpe maka Nnamdi Kanu taa n'Abuja mere ya maka na, "ihe a na-eme ndị igbo bụ arụ. Ọ bụghị naanị Nnamdi Kanu ka a na-eme ya. Ọ bụ Igbo niile ka a na-eme ya. Ya kpatara ha ji agodoro ala ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka".

Kedụ ihe nwaanyị ịgba ọtọ mee ngagharịiwe pụtara?

Nwaanyị iyipu uwe n'ezi bụ oke ihe ịrịbaama, bụ nke na egosipụta omenala dịwara oge gboogboo.

Iji ghọta nke a, e kwesighị ile ya anya n'ụzọ aramara, ịkpụ ugwu n'ala maọbụ ajọ ihe.

Nke bụ eziokwu bụ na ike dị na ahụ ụmụ nwaanyị karịa.

Iji kwanụ ya bụ ike dị n'ahụ ha gboo mkpa, ụmụnwaanyị emegharịla ihe ndị mmadụ na-eche maka ịgba ọtọ.

E kwesiri ị kwanyere ụmụnwaanyị na-eme etu a ugwu pụrụiche maka na ha na-egosi ike, obi ntachi, na nkwuwe okwu.