Nnamdi Kanu News: Ihe isii Ọkaikpe Binta Nyako nyere iwu ka e meere Nnamdi Kanu

Gọọmentị Naịjirịa nwuchigharịrị onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ma malite ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun afọ 2021.
Gọọmentị Naịjirịa kpọchiri ya n'ụlọmkpọrọ ndị uweojii nzuzo bụ Department of State Services (DSS) dị n'Abuja.
Kamgbe ahụ rute ugbua, e kpeela ikpe ya ihe ruru ugboro ugboro n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nke ọkaikpe Binta Nyako nọ n'isi ya.
Gọọmentị Naịjirịa boro ya ebubo ruru iri na ise nke gụnyere ịgbasa na redio sị ka egbuo ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ.
Dịka ikpe a ndị a na-aga n'ihu e nweela ọtụtụ ihe ndị ọkaiwu Kanu rịọrọ sị ka e meere ya dịka o si metụta ikike dịịrị onye.
Ọkaikpe Binta Nyako nabatara ụfọdụ mkpesa ndị ahụ ma sị ka DSS hụ na e mere ha nye Kanu.
Kedụ ihe iwu Ọkaikpe Binta Nyako nyere ya?
Site n'ikpe Ụfọdụ ihe ndị ahụ e meere Kanu gụnyere;
Ikike okpukperechi sọrọ ya
Nnamdi Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya rịọrọ ụlọikpe ka e nye ya ohere ikpere chi ya dịka onye okpukperechi juu nakwa ka e wetere ya ụfọdụ ihe oji e kpe ekpere.
Ọkaikpe Nyako nyere DSS iwu sị ka ha hụụ na Kanu ga na-ekpere chi ya.
Ịgbanwe akwa ndịna
Ọ rịọkwara sị ka a gbanwere ya akwa ndina ebe ọ na-ehi ụra bụ nke ọkaikpe Nyakọ nabatara ma sị ka DSS mee ya.
Ịnabata ndị ọbịa
Ọkaikpe Binta Nyako nyekwara Kanu ikike ịnabata ndị ọbịa gụnyere ezinaụlọ ya, ndị ọkaiwu ya nakwa onye ọbụla chọrọ ịhụ ya n'ụlọmkpọrọ DSS.
Kama onye ahụ ga-anata ikike site n'aka ndị ọkaiwu ya bụ ndị ga-edegara DSS akwụkwọ.
Kanu nwere ohere ịnabata ndị ọbịa ugboro abụọ n'otu izuụka.
Ohere ịhụ ihu eluigwe anya n'ụlọmkpọrọ
Ndị ọkaiwu Kanu mere mkpesa sị maka etu DSS si akpọchibido Kanu n'ime ụlọ naanị ya na-ahụghị ihu eluigwe anya na nke ahụ nwereike imetụta ụbụrụ ya.
Na nzaghachị, ọkaikpe Nyakọ sị ka e nye Kanu ohere ịpụta ezi nara ikuku ndụ nakwa hụ ihu eluigwe anya.
Ịgbanwe uwe ya
Kamgbe a nwuchiri Kanu, naanị otu uwe ka ọ na-eyi mgbe ọ na-apụta n'ụlọikpe.
Ndị ọkaiwu ya mere mkpesa sị ka a gbanweere ya uwe bụ nke ọkaikpe Nyako kwadoro mana ọ ka na-eyikwa otu uwe ahụ.
Ndị ọkaiwu Kanu sị na ndị DSS jụrụ ka ha gbanwere Kanu uwe mana n'ikpe nke ụbọchị 16 Febụwarị, ndị DSS sị na uwe a na-achịtara Kanu bụ uwe isiagụ bụ nke ha sị megidere iwu ha.
Ọkaikpe Binta Nyakọ jụrụ Kanu udịrị uwe ọ chọrọ iyi, ọ sị na ọ bụ uwe e ji maara ndị Igbo bụ uwe isiagụ.
Mana ọkaikpe Nyakọ jụrụ sị ka Kanu ghara iyi uwe na-egosi njirimara ndị ọbụla kama ka o yiri uwe ọbụla masịrị nke na-enweghi ihe esere na ya.
Inye ya ugegbe anya
N'otu aka ahụ ndị ọkaiwu Kanu n'ụbọchị 16 Febụwarị rịọrọ ka e nye Kanu ugegbe anya ọ ga na-eyi maka na anya na-ekochi ya n'ihi nke a.
Ọkaikpe Nyako nyekwara ndị DSS iwu ka ha hụụ na Kanu malitere yiwe ugegbe.
N'ime ihe ndị a niile nke a sị ka e mere ya, naanị ughegbe anya na ịgbanwe uwe bụ ihe ndị ọkaiwu ya sị na emebeghi.
A na-atụ anya na ndị DSS ga-erube isi n'iwu ọkaikpe Nyako ma meere Kanu ihe ndị ahụ tupu ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelu, 2022 bụ mgbe ọzọ a ga-ekpe ike ya eruo.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob).
A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.
Ndị Department of State Services (DSS) nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.
Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015. Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo.
Kamgbe ahụ onweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechi anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ.
N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya.










