Nnamdi Kanu Court: 'O nweghị mgbe Nnamdị Kanu jiri gọọ na ya abụghị onyendụ ndị Ipob' - Ejiofor

Otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifenayi Ejiofor akọwaala na ọnweghị mgbe Nnamdi Kanu jiri gọọ na ya abụghị onyendụ ndị otu Indegenous People of Biafra, Ipob.
Ejiofor kwuru nke a n'akara Twitter ya ụbọchị Tọzde ka ọ na-akọwa ihe juru akwụkwọ akụkọ niile kemgbe Wenezde amalitere ikpe Kanu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Ọkaiwu Naịjirịa n'ikpe dị n'etiti gọọmentị etiti na Nnamdi Kanu, onyeisi ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob), ekwuola na Mazi Kanu gọrọ agọ na ya abụghị onye otu Ipob.
S.M Labaran kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ngwụcha ikpe nke e kpere n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, n'ụbọchị Wenezde a.
Labaran kwuru sị: "Anyị adịla njikere ka ikpe a malite n'uju, mana ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na-achọ ihe ha ga-akọ."
"Ndị akaebe anyị niile adịla njikere, ihe akaebe anyị niile akwụrụla chịm."
"Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ na Nnamdi Kanu gọrọ agọ na ya abụghị onye otu Ipob."
"Otu n'ime ebubo anyị boro ya bụ na ọ bụ onye otu Ipob nke bụ otu gọọmentị machiri amachi, mana ọ sị na ikpe amaghị ya."
"Nke a pụtara na ọ na-agọ agọ na ya abụghị onye otu Ipob. Mana ka o sila dị, anyị dị njikere ịmalite ikpe a."
"Aka m dị ọcha n'ebubo niile gọọmentị boro m" - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu gọrọla ọnụ ya n'ebubo niile gọọmentị Naịjirịa boro ya nke mere ha ji kpụpụ ya ụlọikpe.
Kanu nyere agụgọ a oge a kpọpụtara ebubo iri na ise niile ahụ e boro ya, n'ihu Ọkaikpe Binta Nyako.
Dịka a na-akpọpụta ebubo ahụ n'otu n'otu, Kanu na-ekwu sị: "Ikpe amaghị m".
Oge a kpọpụtachara ebubo ndị ahụ, ndị ọkaiwu Kanu gwara ọkaikpe na ebubo niile ahụ enweghị isi na ọdụ.
Ha kwuru na ha etinyela akwụkwọ ka ụlọikpe kụchapụ ebubo ndị ahụ niile, ma tọhapụ Kanu.
Mana ndị ọkaiwu gọọmentị kwuru na a ga-ekpe ya bụ ikpe ekpe.
Ọkaikpe Nyako kwuru na e kwesịrị inye ohere ka ọkaiwu gọọmentị tinye anya n'akwụkwọ ndị ahụ ndị ọkaiwu Kanu wetara, tupu a malite ikpe ya bụ ikpe.
Ọ gwara ndị ọkaiwu ahụ ka ha kwuo ụbọchị ga-adị ha mma ka e yigharịa ikpe ahụ iji malite.
Oge ha tulechara, Ọkaikpe Nyako tinyere ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị dịka ụbọchị e yigharịrị ikpe ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa ji anwụrụ ose chụsaa ndị nkwado Nnamdi Kanu n'Abuja

Tupu amalite ya bụ ikpe, ọsọ tara n'ụlọikpe ahụ mgbe ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ji anwụrụ ose nke bekee na-akpọ 'tear gas' chụsasịa ndị mmadụ bịara inye Nnamdi Kanu nkwado n'ụlọikpe.
Nke a mere taa bụ Wenezde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022, dịka a kpọtara Mazị Kanu Kanu na ụlọikpe ahụ.
Ya bụ ihe malitere oge akụkọ pụtara na eyigharịala ikpe Kanu.
Ndị nkwado Kanu malitere ịgụ egwu na-eto Kanu, ma na-ekwu na ha chọrọ ịhụ onye ndu ha.

Otu onye ọzọ a makwa ama na Naịjirịa, aha ya bụ Omoyele Sowore, bịakwara sonyere ndị nkwado Kanu.
Cheta na Sowore bụkwa onye gọọmentị Naịjirịa na-ebokwa ebubo na ọ chọrọ ịkụsa Naịjirịa.
Oteghị aka, ụfọdụ ndị ntorobịa kpụchiri ihu ha, jicha mma, bịara chọọ ịwakpo Sowore na ndị otu ya.
Nke a mere ka ndịọrụ nchekwa gbaa anwụrụ ose ma chụsazie mmadụ niile.
Sowore na ndị otu ya banyekwara n'ụgbọala ha gbaa ọsọ ndụ.
E mechara jide otu n'ime ndị ahụ kpuchiri ihu ha, ma nyefee ya n'aka ndị uweojii.

Ihe ndị ọzọ mere gbasara ikpe a

Akụkọ pụtara ihe maka ihe mere na Kanu agbanweghi otu uwe ọ na-eyi kamgbe ọnwa Juun afọ 2021 akpụtara ya ụlọikpe mbụ.
N'ụlọikpe, ndị ọkaiwu gọọmentị gwara Ọkaikpe Nyako na ọ bụ Kanu jụrụ ịgbanwe uwe ya maka na ọ sị na uwe ya bụ 'designer'.
Ọkaikpe Nyako gwara ndị Department of State Services (DSS) ka ha zụtara Kanu uwe 'designer' ọzọ ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọ chọrọ.
N'aka nke ọzọ, ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome kwuru na ha zụtaara Kanu uwe ọhụrụ mana ohere adịghị iji chinye ya uwe ahụ.

Kanu wuchiri n'ụlọikpe n'ebe elekere iri nke ụtụtụ Wenezde.
Mana ọ ka yikwa uwe 'Fendi' ahụ bụ nke ọ na-eyi kamgbe ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ya.
Cheta na Ọkaikpe Nyako nyere ndị DSS iwu ka ha nye Kanu ohere ka ọ gbanwee uwe ahụ.
Ndị ọkaiwu Kanu na-ekwu na ọ bụ n'ihi iji mekpaa ya ahụ ma kụtuo mmụọ ya kpatara ndị DSS ekwebeghị ịhapụ Kanu ka ọ gbanwee uwe ya.
E nyela Nnamdi Kanu akwa ndina dị mma
Na nke dị ka ibe ya, ndị DSS kwukwara na ha emeela ihe Ọkaikpe Nyako nyere ha n'iwu, nke bụ ime ka ahụ dị Kanu mma n'ụlọmkpọrọ.
Ha kwuru na ha agbanweela akwa ndina o ji arahụ ụra, ma nye ya nke bekee kpọrọ 'orthopedic mattress'.
Ha kwukwara na ha enyela ya akwa ọhụrụ a na-atọ n'elu akwa (bed sheets), nakwa akwa e ji ehibe isi (pillow) ọhụrụ.
Ọkaiwu Ozekhome kelere Ọkaikpe Nyako maka nke ahụ.
Etu abalị nke abụọ nke ikpe Nnamdi Kanu si gaa n'Abuja

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu na gọọmentị etiti malitekwara ọzọ, nke mbụ ya n'afọ ọhụrụ a bụ 2022.
Gọọmentị Naịjirịa ji Nnamdi Kanu eji, na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwasa gọọmentị Naịjirịa.
A nwụchiri Mazị Kanu na mba Kenya n'ọnwa Jun afọ 2021, ma kpụlata ya Naịjirịa ebe ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ DSS.
N'ebe ahụ ka e si akpụta ya ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo niile e boro ya.
Ihe mere n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde

Dịka ya bụ ikpe malitere ọzọ, gọọmentị Naịjirịa wepụtara ebubo asatọ ọhụrụ bụ nke ha tinyere n'ebubo asaa ha boburu Nnamdi Kanu.
Nke a welitere ọnụọgụgụ ebubo ha boro ya ruo iri na ise.

Ụfọdụ ihe ndị dị n'ebubo ọhụrụ ahụ gụnyere:
- Na Nnamdi Kanu nyere iwu ka e gbuo ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinụlọ ha
- Na Kanu nyere iwu ka e mebie ụlọọrụ gọọmentị dị icheiche
- Na Kanu kpalitere ndị mmadụ ka ha kụsaa ntuliaka Anambra steeti
- Na Kanu jalitere ndị mmadụ ka ha gbaa ụgbọala na ụlọọrụ gọọmentị Legọs ọkụ
- Na Kanu jalitere ndị mmadụ ka ha wakpoo obi eze Oba nke Legọs ma gbaa ya ọkụ
- Na ọ manyere ndị mmadụ ka ha ghara ịpụta ezi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ... dgz
Mana oge ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu hụrụ ebubo ọhụrụ ndị a, ha kwuru na ha enwetaghị ya n'oge iji nwee ohere lezie ha anya ma mara ihe ha ga-asa maka ya.
Nke a mere ka ọkaikpe Binta Nyako bugharịa ikpe ahụ ka ọ bụrụzie taa bụ Wenezde, iji nye ohere ka ndị ọkaiwu Kanu lebanye anya n'ebubo ọhụrụ ndị ahụ.

Mana ndị ọkaiwu Kanu nyekwara mkpesa gbasara etu ndị DSS si akpaso Kanu agwa n'ụlọ mkpọrọ ha.
Nke a mere ka ọkaiwu Nyako nye iwu ndị a:
- Ndị DSS ga-enye Kanu uwe ọhụrụ ka ọ gbanwee uwe nke ọ na-eyi kamgbe ndị uweojii nwuchiri ya n'ọnwa June
- Ndị DSS ga-enye Kanu ohere ka ọ na-emegharị ahụ (exercise) n'ime ụlọmkpọrọ
- Ndị DSS ga-eme ka Kanu nwee ọnọdụ dị mma n'ụlọ mkpọrọ
Lee ụbọchị eyigharịrị ikpe Nnamdi Kanu

Ọkaikpe Binta Nyako etinyela ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị dịka ụbọchị e yigharịrị ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa.
Nke a mere n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja taa.
Ya bụ ikpe ga-amalite n'elekere mbụ nke ehihie ụbọchị ahụ dịka ọkaikpe Nyako si nye n'iwu.
Etu ikpe Nnamdi Kanu si ruo ebe ọ nọ ugbua
Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja yigharịrị ikpe Kanu ruo Jenụawarị 18, 2022 site n'ụbọchị Ọktoba 21, 2021.
Cheta na mgbe mbụ Kanu gbara n'ihu ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụ n'ọnwa Julai ka anwụchịchara ma tinye ya n'ụlọmkpọrọ ndị Department for State service (DSS) n'ọnwa Juun.
Ọkaikpe Binta Nyako yighariri ikpe ahụ buga ya ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2021, dịka ndị otu Ipob zipụtara ozi iwu onye nọrọ n'ụlọ maka nkwanye ugwu ya bụ ikpe.
Ikpe nke taa bụ Jenụwarị 18, 2022, ga-adọti ruo 19 nakwa 20 nke ọnwa a bụ ụbọchị a na-eche na a ga-ekpebi ikpe ya.
Cheta na gọọmentị etiti Naịjiria kwuputere na ha si mba Kenya nwụchie ma kpọghachite Kanu na Naịjirịa n'ọnwa Juun nke afọ 2021.
Ndị otu Ipob nakwa ọtụtụ mmadụ katọrọ etu e si nwụchie nwaamadi ma na-ekwu na iwu mba ofesi akwadoghi ihe gọọmenti etiti mere.
Mana gọọmenti etiti na-ekwusi ike na Kanu gbara ọsọ ka ikpe mbụ o nwere ka na-aga ihu n'afọ 2017.
Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.
Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.
A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.
Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.
O kwenyere na ma bụrụ onye ofufe Judaism.
Nwụchi, ntọhapụ na nwụchi Nnamdi Kanu ọzọ
Gọọmentị Naịjiria nwụchiri Nnamdi Kanu n'ọnwa Ọktoba afọ 2015, jide ya ihe karịrị otu afọ tupu a tọhapụ ya n'ihe Bekee kpọrọ 'bail' n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ afọ 2017.
Kanu si Naịjiria gbapụ n'agbanyeghi na iwu e nyere ya machiri ya ime nke a. Ka ọ nọ mba ofesi ka ọ malitekwara ịgbasa ozi ya maka nnwereonwe Biafra n'ike n'ike n'elu soshal midia.
A hụrụ Nnamdi Kanu n'ihu ọha mbụ na mba Izrel, n'ụbọchị 22 nke ọnwa Ọktoba 2018, kemgbe e ji achọwa ya. Ihe nkiri bidoro fegharịwa na soshal midia ebe Nnamdi na-ekpe ekpere na mba ahụ.
Ụlọọrụ Facebook mechara machie ya iji ha agbasa ozi n'afọ 2021, mana o mepere aha ọzọ ji na-agbasa ozi ya na-aga n'ihu.
O hibere otu ndị nchekwa ọ kpọrọ Eastern Security Network (ESN), nke ọ sị bụ maka ichekwa mpaghara ala Igbo n'aka ndị ọchị ehi.
N'ọnwa Juun afọ 2021, gọọmentị Naijiria nwụchigharịrị Nnamdi Kanu ma si mba Kenya kpụlata ya Naịjiria ịbịa kpee ya ikpe.
Kemgbe ahụ, ọ pụtala n'ụlọikpe ugboro atọ gụnyere nke ọ pụtara n'ụbọchị 19 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.










