Afcon 2021: Lee ụmụnwaanyị na-agbaka ndị Super Eagles nke Nigeria isi

Ebe foto si, Awaziem/Musa/Olayinka
A na-ekwukarị na "n'azụ nwoke ọbụla na-eme ọfụma, ị ga-ahụ ezigbo nwaanyị na-akwado ya".
Nke a na-egosi n'isi ndị na-agbara otu Super Eagles nke Naịjiria bọọlụ.
Ka ọ dị ugbua, e nwere ndị na-agba bọọlụ bụ ndị ụmụnwaanyị Naịjiria na-anwụrụ maka ụdịrị mma ha mara, ego ha nwere nakwa ihe ndị ọzọ.
Mana ha amaghị na ndị ahụ ha na-anwụrụ agbaghị aka nwaanyị dịka ụfọdụ n'ime ha bụ ndị lụgoro nwaanyị ma jide ụmụ.
Ụmụnwaanyị ndị ahụ nọ na ndụ ndị Super Eagles bụ ndị na-akwado ha ma mgbe obi dị ha mma na ha meriri, ma mgbe ụwa kpụ ha n'ọnụ ọjọọ maka na ha agbataghị nke ọma.
Lee ụmụnwaanyị ndị ahụ kwụ ndị Super Eagles chịm n'azụ:
Ndị ochegoolu 'goalkeepers':
Maduka Emil Okoye:
Kemgbe ọ batara n'otu Super Eagles, enwebeghi nwaanyị a hụrụ ya na Okoye, o nwebeghi nke o tinyere n'elu soshal midia ya, nke o ji enwe nke ọ kparala maka ya n'ajụjụọnụ ọbụla.
Ihe anyị ma ruo ugbua a bụ na ọ dị ka aka ejibeghi ya.

Ebe foto si, Maduka Okoye/Twitter
Francis Uzoho:

Ebe foto si, Francis Uzoho Instagram
Uzoho na Somie nwunye ya gbara akwụkwọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2018.
Ha ji otu nwa nwoke ha gụrụ Odinaka dịka nna ya.
Uzoho bụ ochegoolu n'Omonoia FC dị na mba Cyprus. Ọ malitere ịgbara Naịjiria na ndị na-erubeghi afọ 17, n'afọ 2013.
Daniel Akpeyi:

Ebe foto si, Daniel Akpeyi/Instagram
Akpeyi na Emmanuella nwunye ya ebiela dịka di na nwunye kemgbe afọ 2011.
Foto ebe ha gbara nkwụ gosiri n'intaneti n'ụbọchị 29 nke ọnwa Disemba 2016, ha mere alụmdị na nwunye ha n'ụlọikpe n'ọnwa Juun 2017.
Ha ji ụmụnwoke abụọ.
Akpeyi bụ ochegoolu n'otu Kaizer Chiefs dị na mba Saụt Afrịka. mana ọ malitere ịkụrụ Naịjirịa kamgbe afọ 2005.
John Noble:

Ebe foto si, John noble/instagram
Noble na nwunye ya amụọla ụmụ atọ, otu nwoke na nwa nwaanyị abụọ.
John Noble bụ ochegoolu n'Enyimba FC nke Aba, Abịa steeti, Naịjiria, mana asọmpi African Cup of Nations bụ Afcon 2021 bụ mgbe mbụ a na-akpọku ya ịgbara Super Eagles.
Ndị egwu azụ 'defenders':
William Troost-Ekong:

Ebe foto si, William Troost-Ekong/Instagram
Troost-Ekong yịrị enyi ya nwaanyị ihe karịrị afọ anọ tupu ha amụta diọkpara ha n'afọ 2018.
Amabeghi n'ezie ma ha agbaala akwụkwọ ugbua mana ha na-abọ gba ọla n'aka.
Ọ na-agbara Watford dị na mba Ịnglandị bọọlụ, ma bụrụkwa kaptịn otu Super Eagles ugbua.
Ọ malitere gbawara ndị Super Eagles bọọlụ n'afọ 2016, ka ọ gbachara ndị mba Netherlands site afọ 2011 ruo 2013.
Kenneth Omeruo

Ebe foto si, Kenneth Omeruo Instagram
Omeruo lụrụ Chioma nwunye ya n'ọnwa Mee nke afọ 2018.
Ha amụọla nwa nwaanyị abụọ.
Kenneth Omeruo na-agbara C.D Leganes dị na mba Spain bọọlụ mana kamgbe afọ 2009 ka o bidoro gbawara Naịjirịa bọọlụ.
Chidozie Awaziem

Ebe foto si, Chidozie Awaziem
Awaziem na Obiageli enyi ya nwaanyị amụọla otu nwa nwaanyị.
Ha ayịala dịka nwoke na nwaanyị ihe karịrị afọ anọ, anyị ahụbeghị ihe gosir na ha alụọla onwe ha.
Awaziem na-agbara otu Alanyaspor dị na mba Turkey bọọlụ ma na o bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2017.
Olisa Ndah

Ebe foto si, Olisa Ndah Instagram
Amabeghi ma o nwere enyi nwaanyị n'ihi na o nwebeghi nke o gosiputara.
Ọ na-agbara ndị Orlando Pirates dị na mba Saụt Afrịka bọọlụ, mana o bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2019.
Ola Aina

Ebe foto si, Ola Aina/Instagram
Ola Aina e ji 'Mr Lulu' mara egosibeghi anyị na ụwa onye ji obi ya aka ugbua.
Ọ na-agbara Torino FC dị na mba Itali bọọlụ mana o bidoro gbawara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2017, ka ọ gbachara ndị mba Inglandi site afọ 2011 ruo 2016.
Zaidu Sanusi

Ebe foto si, Zaidu Sanusi Instagram
Ka ọ dị ugbua, amabeghi ma e nweela nwaanyị aka ya kparala ya n'ihi na enweghi onye o gosiri anyị.
Ọ na-agbara FC Porto dị na mba Pọtụgal bọọlụ. O bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2020.
Tyronne Ebuehi

Ebe foto si, Tyronne Ebuehi/Instagram
Enwebeghi nwaanyị ọ gbara n'anwụ sị na ọ bụ enyi nwaanyị maọbụ nwunye ya.
Ebuehi na-agbara Venezia FC dị na mba Itali bọọlụ mana o bidoro ije ya ịgbara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2017.
Semiu Ajayi

Ebe foto si, Semi Ajayi Instagram
Ụmụnwaanyị ka na-enyo ka onyokomita inyochapụta onye bụ ọdịnobi Ajayi.
Ọ na-agbara West Bromwich Albion dị na mba Ịnglandị bọọlụ mana o bidoro ịkụrụ Naịjịra bọọlu n'afọ 2013.
Ndị egwu etiti 'midfielders'
Wilfred Ndidi

Ebe foto si, Wilfred Ndidi/instagram
Ndidi ọ na-aba gị anya? Mechie anya gị n'ihi na aka ji ya jisiri ya ike.
Ọ lụrụ Chidinma nwunye ya n'afọ 2019.
Ha amụọla otu nwa nwaanyị.
Ọ na-agbara Leicester City dị na mba Ịnglandị bọọlụ mana o bidoro gbawara Naịjirịa 2013.
Joe Aribo

Ebe foto si, Joe Aribo
Nne ọ na-achaba gị n'anya? Anyị ahụbeghi nwaanyị ọbụla bụ onye nke o ji aka. Anya anyị legharịrị egosighi ma e nwere nwaanyị na-ekopu Aribo isi.
Ọ na-agbara Rangers FC dị na mba Skọtlandị bọọlụ, mana o bidoro njem ya dịka onye egwuregwu bọolụ ndị Naịjrịa n'afọ 2019.
Kelechi Nwakali

Ebe foto si, Kelechi Nwakali Instagram
Ruo ugbua, Kelechi egosibeghi ụwa nwaanyị ji obi ya. Ọ na-agbara SD Huesca FC dị na mba Spen bọọlụ mana o bidoro njem ya dịka onye egwuregwu bọolụ ndị Naịjrịa n'afọ 2015.
Chidera Ejuke

Ebe foto si, Chidera Ejuke Instagram
Amabeghi ma aka eji ya n'ihi na ahụbeghi nwaanyị ọbụla ọ kpọrọ nke ya.
Ọ na-agbara CSKA Moscow dị na mba Rọshịa bọọlụ, ma na Naịjrịa, ọ malitere gbawa n'afọ 2020.
Frank Ogochukwu Onyeka

Ebe foto si, Frank Onyeka/Instagram
Anyị gbara anya ka tọọchị na-achọ nwaanyị ji obi Onyeka, mana enweghi nke anyị hụrụ.
Ka ọ dị ugbua, amabeghi ma aka nwaanyị ọbụla akparala ya.
Ọ na-agbara Brentford FC dị na mba Ịnglandị bọọlụ ma na Naịjrịa, ọ malitere gbawa n'afọ 2020.
Ndị na-agba n'ihu
Taiwo Awoniyi

Ebe foto si, Taiwo Awoniyi/Instagram
Taiwo na nwunye ya bụkwa Taiwo ebiela dịka di na nwunye kemgbe afọ 2019.
Ha mụrụ nwa ha nwoke n'afọ 2020. Ha bi na Jamini ebe ọ na-agbara Union Berlin FC.
Ọ malitere ịgbara Naịjirịa na 2013.
Moses Simon

Ebe foto si, Moses Simon/Instagram
Ya na IbukunOluwa nwunye ya alụọla afọ isii.
Ha amụọla nwa nwaanyị abụọ.
Simon na-agbara Nantes FC dị na mba Frans bọọlụ.
Ma na ọ malitere ịgbara Naịjirịa na 2013.
Ahmed Musa

Ebe foto si, Ahmed Musa/ Instagram
Musa ji nwunye abụọ ugbua. Ọ lụburu Jamila n'afọ 2013 mana isi ha apụtaghị. Ha kposara n'afọ 2017.
O wee lụọ Juliet n'ọnwa Mee afọ 2017, lụọkwa Mariam n'ọnwa Julaị 2021.
O ji ụmụ anọ, nwoke atọ na otu nwaanyị. Ọ na-agbara Fatih Karagumruk dị na mba Turkey bọọlụ.
Ma na ọ malitere ịgbara Naịjirịa na 2011.
Peter Olayinka

Ebe foto si, Olayinka Peter/Instagram
Olayinka lụrụ Yetunde nwunye ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Juun 2021.
Yetunde bụ ome ejije na Naịjirịa nke e ji Nollywood mara. Yetunde nwunye Olayinka na-eme ejije ndị Yoroba nke a maama ka 'Yollywood'.
Ọ na-agbara Slavia Praha dị na mba Czech Republic bọọlụ, mana o bidoro gbaara Naịjirịa n'afọ 2019.
Henry Onyekuru

Ebe foto si, Henry Onyekuru/Instagram
Ya na Esty, nwunye ya gbara akwụkwọ n'afọ 2019, mana ha yịrị ọtụtụ afọ.
Ha amụọla otu nwa nwoke na otu nwa nwaanyị.
Ọ na-agbara Olympiacos dị na mba Gris bọọlụ. Onyekuru bidoro gbawara Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2019.
Sadiq Umar

Ebe foto si, SADIQ UMAR/Instagram
Ọ dị ka obi akabeghi Umar igosi ụwa onye ji obi ya, mana anyị nyochapụtara na o dị ka o nwere nwaanyị nọ na ndụ ya a na-akpọ 'Prada'.
Ọ na-agbara Almeria FC dị na mba Spen bọọlụ, mana Umar bidoro gbawara Naịjirịa bọọlụ 2016.
Kelechi Iheanacho

Ebe foto si, Kelechi Iheanacho/Instagram
Iheanacho a na-etu 'Senior Man' na-agba anya ka tọọchị iji chọta nwaanyị dị mma.
Ọ gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka.
O bidoro gbawa Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2013, mana ọ na-agbara ndị otu Leicester City dị na mba Ịnglandị bọọlụ.
Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Samuel Chukwueze
Amabeghi ma e nwere nwaanyi Chukwueze hapụrụ ka o jide obi ya ugbua.
O bidoro gbawa Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2015, mana o bi na Spen ebe ọ na-agbara Villareal CF bọọlụ.
Alex Iwobi

Ebe foto si, Alexander Iwobi/Instagram
Iwobi bụ nwoke na-achaba ọtụtụ ụmụnwaanyị anya, ma n'ụlọ ma n'ama.
Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi ma o nweela nwaanyị ọma ọ nabatarala n'ime obi ya.
Ya na enyi ya nwaanyị nke ụwa niile mabu, gbasara n'afọ 2017 ka ha yịchara afọ anọ.
O bidoro gbawa Naịjirịa bọọlụ n'afọ 2015, mana ọ gbarala ndị mba Inglandi bọolụ site afọ 2011 ruo 2013.
Gịnị bụ Afcon?
AFCON pụtara African Cup of Nations bụ Iko Mba Afrịka nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke.
Ndị na-ahazi ya bụ otu jikọtara egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) na Bekee.
AFCON bụ otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ewulite ịdị n'otu mba Afrịka niile, nke a bụ uru ọ baara.
A na-agbakarị ya n'ọnwa Juun/Julaị n'ime afọ abụọ ọbụla. Ọ na-efu otu ọnwa iji gbaa ya, mana ọrịa ozuruụwa ọnụ bụ Covid - 19 atụgharịala mgbe a kụrụ Afcon 2021, n'ihi na a kụrụ ya na 2022.
Lee tebulu AFCON 2021
Ebe Naịjirịa kwụ n'AFCON kamgbe ọ malitere
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa malitere ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) n'afọ 1963 bụ ebe e nyere ha ọkpụ goolu iri ma gbapụ ha n'ogogo mbụ.
Asọmpi AFCON nke afọ a ga-eme ya ugboro iri na itoolu ha ga-agba.
Kamgbe ahụ ha ebutela iko a ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 na 2013, gbaa ndị abụọ ugboro atọ.









