Nnamdi Kanu Court Case: Ihe ọkaikpe Nyako kwuru mgbe ọ na-apịachi ikpe ya na Jenuawarị 18, 2022

Nnamdi Kanu/Ifeanyi Ejiofor/Mike Ozekhome
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu/Ifeanyi Ejiofor/Mike Ozekhome n'ụlọikpe na Jenụwarị 18, 2022
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ekwuola ka ikpe Nnamdi Kanu gaa n'ihu echi bụ Jenụwarị 19, 2022.

N'uche ya, mbugharị a ga-enyere ndị ọkaiwu Kanu aka inwe mkparịtaụka n'ụloikpe mgbe onye ọbụla pụchara ebe ahụ.

Ọkaikpe Nyako kwuru ka e nye Kanu uwe ọhụrụ dịka ọ na-apụta n'ụlọikpe echi bụ Jenụwarị 19, 2022.

O kwukwara na ọ chọghị ka ọkaikpe Kanu gaa leta ya n'ụlọ mkpọrọ DSS tupu echi eruo.

Ọkaikpe Nyako kwuru ka DSS gbaa mbọ hụ na ọkaiwu Kanu ekpesaghị agwa ọjọ ọbụla gbasara ha.

O gwakwara DSS ha hụ na ha metara Kanu mma ma nye ya ezigbo nri.

Ihe mere mgbe Nnamdi Kanu pụtara n'ụlọikpe na Jenụwarị 18, 2022

Ọkaiwu Benson Ibanoye, Maxwell Okpara esq, Ifeanyi Ejiofor, Oluchi Vivian nakwa Ozekhome Mike (ESQ) nọchitere Nnamdi Kanu, ebe S.M Labaran, Adewumi Ali na Ogochukwu bụ ndị nọchitere anya gọọmenti n'ụlọikpe ebe a na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe taa n'Abuja.

E kweghị ka Bruce Fein bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu si mba Amerịka bata n'ụlọikpe ahụ makana o gosighị akwụkwọ nyere ya ikike isonye n'ikpe ahụ.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Ụlọikpe na-ekwu na aga-eji ebubo 15 ndị etikwasara n'elu ndị eboburu Nnamdi Kanu wee nọchie anya nke e boro ya n'afọ 2020.

Cheta na Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Ipob. A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.

Ndị DSS nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.

Ọ gaa ụlọikpe na Nọvemba 18 2015, Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo bee ya, dịka akụkọ siri kwuo.

Aha onyonyo, Nwunye Nnamdi Kanu gwara ndị BBC Igbo na ọ maghị ebe dị ya nọ

Kamgbe ahụ onweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ n'afọ 2018.

N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

Na Juun 27, 2021, ndị Interpol wakporo ya na obodo ọ nọ. Ufọdụ dị na ọ bụ Kenya, ụfọdụ sị na ọ bụ ebe ọzọ, mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na ọ bụghị na obodo ya ka a nwuchiri ya.

Ndị ọkaiwu kwadoro Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Abuja eb a nọ kpe ikpe ya n'ụbọchị Jenuwarị 18, 2022
Nkọwa foto, Ndị ọkaiwu kwadoro Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Abuja ebe a nọ kpe ikpe ya n'ụbọchị Jenuwarị 18, 2022

Ikpe atọ a ga-elebanye anya maka Nnamdi Kanu gụnyere:

  • Iwepụ Kanu n'ụlọ mkpọrọ Department of State ma wega ya n'ụlọ mkpọrọ nkịtị.
  • Itinye akwụkwọ maka ịtọghapụ Kanu.
  • Ọjụjụ nke mbụ a jụrụ gbasara ebubo mbụ e boro ya.

Ndị ọkaiwu kwadoro Kanu kwuru na ha ntụkwasa ebubo ọhụrụ ndị a kwam kwam (abali fotere taa) e gosighị ikpe kwụ ọtọ kama mwakpo.

Ọkaiwu Kanu kwuru na ihe a bụ nhazigharị ebubo Kanu nke ugboro isii, na gọọmenti etiti kpacha anya e me ya ka ha wee mee ka ikpe a ghara inwe isi.

Ụfọdụ ihe onye ntaakụkọ anyị hụrụ tupu amalite ikpe Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Abuja n'ụbọchị Jenuwari 18, 2022
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Abuja n'ụbọchị Jenuwari 18, 2022

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka Ifeanyi Ejiofor bụ otu n'ime ọkaiwu Kanu tụrụ ụkwụ n'ụlọikpe.

Ọ hụkwara ka ndị nchekwa wụchiri ụlọikpe, ma hụkwa na anaghị ekwe ndị mmadụ rute nso ya bụ ụlọikpe, na-abụghị naanị e nyere gị ikike ịbata.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Kemgbe a nwụchiri ya n'ọnwa Juun, nke a ga-eme ya ugboro atọ a na-akpọpụta ya ụlọikpe.

Lee ụfọdụ foto onye ntakụkọ anyị setere n'ụlọikpe taa.

Mike Ozekome na Ifeanyi Ejiofor nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na-eche ka ikpe Nnamdi Kanu nke Jenụwarị 18, 2022 malite.
Nkọwa foto, Mike Ozekome na Ifeanyi Ejiofor nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na-eche ka ikpe Nnamdi Kanu nke Jenụwarị 18, 2022 malite.
Bruce Fein bụ ọkaikpe kanu si mba Amerịka
Nkọwa foto, Bruce Fein bụ ọkaikpe Nnamdi kanu si mba Amerịka
SM Labaran bụ otu ọkaiwu nọchitere anya gọọmenti etiti n'ikpe Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, SM Labaran bụ otu ọkaiwu nọchitere anya gọọmenti etiti n'ikpe Nnamdi Kanu

Lee ebubo 15aghazigharịrị ọhụrụ e boro Kanu dịka ọ ga-agba n'ụlọikpe taa

Federal High Court Abuja

Gọọmenti Naịjirịa tụkwasịrị ebubo iri na ise ọhụrụ n'elu nke ha na-ebo Nnamdi Kanu, dịka ikpe ya na-aga n'ihu taa bụ Jenuwarị 18, 2022 na Federal High Court dị n'Abuja.

Onye binyere aka n'akwụkwọ e ji depụta ebubo ọhụrụ 15 a bụ onyeisi na-ahụ maka ịgba akwụkwọ ikpe a kpọrọ "Director of Public Prosecution of the Federation" na Bekee, n'aha ọkaiwu ukwu nakwa minista na-ahụ maka ikpemkwụmọtọ bụ Abubakar Malami.

Ebubo atọ mbụ e boro ya bụ:

Ebubo nke mbụ

Na Nnamdi Kanu bụ nwoke tozuru si n'Afaraukwu lbeku, n'okpuruọchịchị Umuahia Nọt n'Abia Steeti n'afọ 2021 dịka onye otu ma bụrụkwa onyeisi Indigenous People of Biafra (IPOB) otu akapụrụ, megidere iwu dịka otu ndị omekome nke Gọọmentị Etiti Naịjiria, site n'ikwuputa n'igwe nke a nụrụ na Naịjirịa n'ogige nke ụlọomeiwu ma yiekwa ndị mmadụ egwu ọnwụ megidere iwu obodo bụrụ agba nke mbụ (2)(6) nke megidere iwu iyi ọha egwu atụgharịrị n'afọ 2013.

Ebubo nke abụọ

Na ya bụ Nnamdi Kanu yiri ndị mmadụ egwu ọnwụ site n'ikwupụta ya n'igwe okwu, nke a nụrụ na Naịjirịa.

Na o yikwara ndị mmadụ gahiere n'iwu o hibere maka ịnọrọ n'ụlọ (sit at home) nke mere na ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ụlọahịa makwa ọba ahịa mmanụ ụgbọala mechiri emechi.

Ebubo nke atọ

Na ọ kpọrọ okwu ka e gbuo ma machie ndị ọrụ nchekwa na ndị bee haa.

Lee ebubo ndị ọzọ ebe a

  • Na Kanu ji igwe redio ya ziza ozi ya site na London ebe ọ na-etu ọnụ na ọ ga-ekewa mpaghara ọwụwa anyanwụ, South South nakwa ụfọdụ ebe dị na Benue, Kogi steeti nke Naịjirịa.
  • Na Kanu ji ozi ọ na-ezi n'igwe redio ya dị na London akparị onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari dịka ọ kpọrọ ya onye na-emetọ ụmụaka, oyi ndụ egwu, efulefu nakwa onye na-eme ihe ọjọ.
  • Na Kanu tụbatara redio transmitter akpọrọ TRAM 50L nke o zoron'ime n'akpati ahịa a ga-edowe n'Ihiala, Anambra steeti.
  • Na Kanu kpọrọ onwe ya onye otu Ipob gọọmenti machiri dịka otu oyi egwu.
  • Na Kanu si n'ozi ya gwa ndị mmadụ ha ga gbuo ndị ọrụ uweojii Naịjirịa.
  • Na Kanu ji ozi ya yi ndụ egwu mgbe o turu ọnụ na ndị mmadụ ga-anwụ.
  • Na Kanu ji ozi o na-eziza n'igwe redio na London were gwa ndị mmadụ ha nọrọ n'ụlọ maọbụ egbuo ha ma ha daa iwu a.
  • Na Kanu ji igwe redio ya zizaa ozi kpalitere ndị mmadụ ka ha mee ngaghariwe n'ike nke ga-emegide gọọmenti etiti.
  • Na ọ dara iwu iyi egwu mgbe ọ gwara ndị mmadụ ka ha gbaa ọtụtụ ngwa ọrụ gọọmenti ọkụ.
  • Na ọ dara iwu iyi egwu mgbe ọ gwara ndị mmadụ ka ha gbaa ọtụtụ ụgbọala e ji eme njem gọọmenti ọkụ nke butere ndatụ akụ na ụba puruiche.
  • Na Kanu si n'ozi ya gwa ndị otu ya ka ha mepụta ogbunigwe.
  • Na Kanu kpara agwa oyi egwu site n'ikwụsị ntuliaka Anambra steeti ma memina ngalaba ndọrọndọrọchịchị nakwa akụ na ụba Naịjiria.
  • Na Kanu gwara onye ọbụla na edoweghị iwu nọrọ n'ụlọ depụta okwu ikpeazụ ya.

Etu ikpe Nnamdi Kanu si ruo ebe ọ nọ ugbua

Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja yigharịrị ikpe Kanu ruo taa bụ Jenụawarị 18, 2022 n'ụbọchị Ọktoba 21, 2021.

Cheta na mgbe mbụ Kanu gbara n'ihu ụlọikpe ukwu dị n'Abuja bụ n'ọnwa Julai ka anwụchịchara ma tinye ya n'ụlọmkpọrọ ndị Department for State service (DSS) n'ọnwa Juun.

Ọkaikpe Binta Nyako yighariri ikpe ahụ buga ya ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2021, dịka ndị otu Ipob zipụtara ozi iwu onye nọrọ n'ụlọ maka nkwanye ugwu ya bụ ikpe.

Ikpe nke taa bụ Jenụwarị 18, 2022, ga-adọti ruo 19 nakwa 20 nke ọnwa a bụ ụbọchị a na-eche na a ga-ekpebi ikpe ya.

Cheta na gọọmentị etiti Naịjiria kwuputere na ha si mba Kenya nwụchie ma kpọghachite Kanu na Naịjirịa n'ọnwa Juun nke afọ 2021.

Ndị otu Ipob nakwa ọtụtụ mmadụ katọrọ etu e si nwụchie nwaamadi ma na-ekwu na iwu mba ofesi akwadoghi ihe gọọmenti etiti mere.

Mana gọọmenti etiti na-ekwusi ike na Kanu gbara ọsọ ka ikpe mbụ o nwere ka na-aga ihu n'afọ 2017.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nwannekaenyi "Nnamdi" Kanu chọpụtara otu Indigenous People of Biafra n'afọ 2014.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ kewara ma hibe mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra steeti mana ka alụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde , atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere redio Biafra n'afọ 2009 nke e hibere na London ma na-ezipu ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

Ọ gara mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) tupu ọ gawa London.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.