Nnamdi Kanu Update: Ndị DSS kwụrụ Nnamdi Kanu agụụ abalị abụọ, mana ha enyewela ya nri ugbua - Ejimakor

Aloy Ejimakor, bụ otu n'ime ndị ọkaiwu na-anọchite Nnamdi Kanu ekwuola na ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ 'Department of State Services' (DSS) amalitekwala inye Kanu nri.
Nke a na-abịa dịka ha (bụ ndị ọkaiwu Kanu) kwuburu na ndị DSS ekweghị enye Kanu nri kamgbe ụbọchị Sọnde ruo ụbọchị Mọnde, abalị ise na abalị isii nke ọnwa Disemba.
Mana n'ụtụtụ taa bụ Fraịde, abali iri nke Disemba, Ejimakor gwara BBC Igbo na Nnamdi Kanu ebidola riwe nri.
Ejimakor kwuru na ya nọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia steeti ebe ikpe ọsọ gbasara Nnamdi Kanu na-aga n'ihu.
Oge akụkọ a pụtara n'oge mbụ, ụfọdụ ndị mmadụ malitere ikwu na o bụ kamgbe Orji Uzor Kalu gachara leta Nnamdi Kanu na mkporọ ka ndị DSS malitere ịta Kanu ahụhụ.

Ebe foto si, Alloy Ejimakor/Facebook
Mana Kalu, onye bụ Sịnetọ na-anọchite anya Abia North, kwuru na aka ya adịghị na ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Ahunanya azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ ya ka o tinye ọnụ n'okwu a.
Onweghị mgbe m ji gwa ndị DSS ka ha kwụsị inye Nnamdi Kanu nri - OUK

Ebe foto si, Senator Orji Uzor Kalu/Facebook
Orji Uzor Kalu ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ya gwara ndị ụweojii nzuzo bụ DSS ka ha kwụsị inye Nnamdi Kanu nri.
Cheta na ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor boro ebubo na Mazi Kanu eribeghị nri kamgbe ụbọchị ụka, n'ihi na ndị DSS ekweghị enye ya ihe oriri.
Nke a kpatara ọtụtụ mmadụ ji malite ikwu na ọ bụ kamgbe Orji Uzor Kalu gachara leta Nnamdi Kanu ka ndị DSS ji kwụsị inye ya nri.
Mana Kalu, bụ aka chịburu Abia steeti, kwuru na ndị na-agbasa asịrị ahụ bụ ndị ọjọọ chọrọ itinye esemokwu n'etiti ya na ụmụnne ya.
O kwuru sị: "Onweghị ihe mmadụ ga-eme n'ụwa ka ndị mmadụ ghara ikwu okwu gbasara ya."
"Ọ bụrụ na m agaghị nleta ahụ, ndị mmadụ ga-ata m ụta; ugbua m gara ya bụ nleta, ndị mmadụ na-ekwukwa okwu."
"Ọ bụrụ na ihe ha chọrọ ime bụ ibute esemokwu n'etiti mụ na ụmụnne m, nke ahụ agaghị enwe isi."
"Nke ahụ bụ igbu oge, maka ahụrụ m ndị nke m n'anya, ha hụkwara m n'anya."
"Onye ọbụla kpọrọ m asị, aga m eji ịhụnanya kwụọ ya ụgwọ."
Nnamdi Kanu eribeghi nri kemgbe ụbọchị ụka - Barr Ejiofor

Ebe foto si, Getty Images
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru na Nnamdi Kanu eribeghi nri kemgbe ụbọchị ụka.
O kọwara na ọ chọpụtara nke a mgbe ọ gara leta ya n'ụbọchị Monde n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ebe e ji ya.
Ọ sị na agụrụ a na-akwụ Kanu bụ maka ịta ya ahụhụ na ndị ọkaiwu ya na-eti mkpu maka ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya.
O kwukwara na Kanu gwara ya na iwu niile ụlọikpe nyere n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba apụtabeghi ihe.
"Kanu anyị na-anọchite anya ya bụ onye ikpe ọbụla amabeghi, nke mere na DSS enweghi ikike ọbụla igbochi ya n'iwenta ikike ndị ruuru ya" ka Ejiofor kwuru.
O nweghi ihe ndị DSS kwuru maka nke a dịka BBC gbalịrị ịnweta ha.
Ejiofor kwukwara na ọ ga-agaghachi ụlọikpe mee mkpesa maka nke a.













