Nnamdi Kanu News: Ihe Nnamdi Kanu gwara m taa - Ọkaiwu Aloy Ejimakor

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, onyendu ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola ihe ọ gwara ya mgbe ha gara zute ya n'ụlọmkpọrọ.

Ọkaiwu Ejimakor kwuru na ya na Kanu na ndị ọkaiwu ya ndị ọzọ gụnyere Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na Ọkaiwu Maxwell Opara zutere, ebe ha kpara maka ikpe ya a ga-ekpe n'ụbọchị Wenezde, Nọvemba 10.

O kwuru na Kanu ji n'aka na a ga-ewepụ ya n'ụta mgbe a ga-ekpecha ya bụ ikpe.

N'otu aka ahụ, Ejimakor kwuru na Nnamdi Kanu ji ohere nzukọ ha na-ekele ndị otu ya na ndị nkwado ya.

Cheta na ụlọikpe yigharịrị ikpe Kanu ruo Nọvemba 10 ka e kpechara ya n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba.

Marakwa na gọọmentị Naịjiria nwụchiri Nnamdi Kanu kemgbe 27 nke ọnwa Juun afọ 2021, ma bo ya ebubo metụtara iyi ndị egwu nakwa ihe ndị ọzọ so ya.