Nnamdi Kanu news: Ifeanyi Ejiofor sị na ọ sị ka ndị Ipob buo ọnụ ruo oge a ga-akpọputa ya ụlọikpe

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) esila n'ụlọmkpọrọ zie ndị otu ya ozi, dịka ọkaiwu ya siri kwuo.

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu ya dere n'akara Facebook ya na ọ sị ka ndị otu ya na ndị na-akwado ya malite ibu ọnụ aṅụghị mmiri nke Bekee kpọrọ 'dry fasting', ruo mgbe a kpọpụtara ya ụlọikpe.

Ọkaiwu Ejiofor sị na dịka Kanu na-ekele ndị otu ha maka nkwado ha, ọ gwakwara ha ka na-ebu onwe ha ọfụma, n'usoro iwu obodo nabatara.

Ejiofor kwukwara na enweghi ebe a kpụgara Kanu, na ọ ka nọ n'Abuja.

O kwuru nke a iji saa akụkọ ụgha niile na-efegharị na e bugara Kanu mba Chaịna na Izrel.

O kwukwara na Kanu ga-apụta n'ụlọikpe n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba 2021, na enweghi ihe ga-akwụsị gọọmentị etiti Naịjiria ịkpụpụta ya ụbọchị ahụ.

Ọkaiwu Ejiofor kwuru na ọ tụrụ Kanu n'anya na ndị mmadụ na-ebugharị akụkọ ụgha na e nwere akwụkwọ a sị ya binye aka na ya tupu a tọhapụ ya.

Ọ kpọkuru ndị otu ya sị ha egela ya bụ akụkọ ụgha ntị.

Ọ karịala ọnwa atọ kemgbe ọnwa Juun gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ha na-ebo ebubo maka ịkpa nkata megide Naịjiria.

Kemgbe ahụ, ndị nkwado ya ji ụbọchị Mọnde niile eme ụbọchị nọrọ n'ụlọ iji mee ka gọọmentị kpọpụta ya n'ụlọikpe.

Gọọmentị akpọpụtaghị ya n'ụlọikpe n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị mgbe e bu ụzọ pụta ikpe ikpe ya.

Aha onyonyo, Ifeanyi Ejiofor