Nnamdi Kanu Court Case: Ihe anyị ma gbasara ikpe Nnamdi Kanu e kwesịrị ikpe n'Abia taa

Ụlọikpe ukwu dị n'Ụmụahịa, Abịa steeti eyigharịala ikpe ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara gọọmentị etiti bụ nke e kwesịrị ikpe taa bụ abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba.
Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor ziputara ozi ebe o kwuru na ụlọikpe ahụ yigharịrị ya bụ ikpe ma buga ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Nọvemba.
Ejimakor kwuru na nyigharị a wutere ya n'ihi na ikpe a bụ nke na-achọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ha sị na gọọmentị etiti nwụchiri n'ụzọ ezighi ezi.
Ihe mere n'ụlọikpe taa n'okwu ikpe Nnamdi Kanu
Dịka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara gọọmentị etiti akwụkwọ n'Ụmụahịa, Abịa steeti, maka etu ha si kpụlata ya ma jide ya kemgbe ọnwa Juun, ụlọikpe asịla ha laa taa ma chebiri mgbe a ga-enyefe ọkaikpe ọzọ ikpe ahụ.
Ọkaikpe K.C Okereke bụ onye nọbu n'isi ikpe a nyere iwu a n'ikpe nke gara aga, ka e nyefee Ọkaikpe ukwu nke steeti Abịa ya bụ ikpe ka o nwee ike nye ya ọkaikpe ọzọ.
Mgbe Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu na ndị otu ya rutere n'ụlọikpe taa bụ 7 nke ọnwa Ọktoba, ha hụrụ na enyefebeghi ọkaikpe ọzọ ya bụ ikpe, mana e kwere ha nkwa na ozi ga-eru onye ọbụla ma ikpe ahụ banye ọkaikpe ọzọ n'aka.
Ejimakor gwara BBC Igbo na ihe mere na enyefebeghi ya bụ ikpe bụ n'ihi na ndị ụlọikpe ka si ezumike ha gara kemgbe otu ọnwa lọta, dịka ọ bụ taa ka ha bidoro ọrụ ọzọ.
O kwukwara na ọ bụghị naanị ikpe Kanu ka nke a metụtara, na o metụtakwara ikpe ndị ọzọ nke ụlọikpe ahụ ji.
Onye ntaakụkọ BBC gara n'ụlọikpe ahụ hụrụ ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa n'ime ma na gburugburu ụlọikpe ahụ.
Ọ hụkwara na e gbochiri ndị mmadụ isi mpaghara ụzọ Ikot Ekpene nke dị nso BCA nakwa ụzọ ndị ọzọ dị nso ụlọikpe ahụ, agafe.
Lee ka ikpe Nnamdi Kanu siri gaa taa n'Umuahia

Ụlọikpe ukwu dị n'Umahia, Abia steeti ebugharịala ikpe dị n'etiti Mazi Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa.
Ọkaikpe K.C Okereke nyere iwu a n'ụbọchị Tuzde, dịka ya bụ ikpe malitekwara ọzọ.
Naanị mmadụ iri ka e kwere ka ha bata n'ime ụlọikpe ahụ, anọ n'ime ha bụ ndị ntaakụkọ, nke onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ otu n'ime ha.
Oge ya bụ ikpe malitere, Ọkaikpe Okereke chetaara ndị ọkaiwu na-ekpe ya bụ ikpe na ya onwe ya abụghị onye kwesịrị ikpe ikpe ahụ.
O kwuru sị: "Unu chetara na oge a malitere ikpe a, ndị ọkaikpe nọ ezumike."
"Abụ m ọkaikpe e si Ohafia zite iji kpebie ikpe ndị dị mkpa."

"Ugbua, ọ fọla naanị abalị iri ka ezumike ahụ kwụsị, nke pụtara na aga m alaghachi Ohafia ebe e si zite m."
"N'ihi nke a, aga m ezighachiri Ọkaikpe Ukwu Abia Steeti akwụkwọ ikpe a ka ọ nyezie ya onye ọkaikpe ga -ekpe ya."
Ọkaikpe Okereke kwuru na ọ ga-emechi ikpe nke taa ma yigharịa ya ka ọ dị n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2021.

Cheta na ọkaiwu Mazị Kanu bụ Aloy Ejimakor gbara gọọmentị etiti akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu nke Abia steeti dị n'Umuahia.
Ndị ọrụ nchekwa kpachiri ụzọ niile na-aga ụlọikpe ahụ n'ụbọchị Tuzde.


Onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na onweghị onye ọbụla a na-ekwe ka ọ banye n'ime ụlọikpe ahụ n'ụtụtụ taa bụ Tuzde.
"Ndị uweojii na ndị agha mechiri okporo ụzọ si Ikot-Ekpene 'road' gawa 'St Finbars'," Onye ntaakụkọ anyị kwuru.
"Ọ bụladị ndị na-arụ n'ime ụlọikpe ahụ, onweghị onye ndị ọrụ nchekwa na-ekwe ka ọ banye ebe ahụ ugbua."

"Nnukwu mmiri na-ezokwa ebe a, tinyere ụzọ niile ndị ọrụ nchekwa mechiri, oke kpachikpachi ụzọ dị ebe a ugbua."
N'elekere itoolu nke ụtụtụ taa ka ikpe a kwesịrị ịmalite, mana ndị uweojii na ndị agha na-akpagharị n'okirikiri ụlọikpe ahụ niile.
BBC nọ n'Umuahia iwetara gị etu ya bụ ikpe ga-esi gaa taa.

Maka gịnị ka Nnamdi Kanu jiri gbaa gọọmentị akwụkwọ?
Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor chọrọ ka ụlọikpe kpebie ma etu gọọmentị Naịjirịa siri wakpo ụlọ Mazị Kanu n'afọ 2017 o ziri ezi n'iwu.
Ikpe nke a bụkwa maka nnwuchi a nwuchiri Kanu n'ọnwa Jun 2021, na mba Kenya, tụọ ya mkpọrọ abalị asatọ tupu akpụlata ya Naịjirịa.
Cheta na ọ bụ nke a kpatara Nnamdi Kanu jiri gbaa ọsọndụ pụọ na Naịjirịa, mana e mechara hụ ya na Jerusalem n'afọ 2019.
N'afọ 2021, a nwụchiri Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.

Kanu na ọkaiwu ya bụ Ejimakor na-ekwukwa etu e si nwụchie Kanu dịka onye ohi, megidere iwu ikike dịrị mmadụ nke bekee na-akpọ 'human rights violation'
N'ihi nke a, ha chọrọ ka gọọmentị kwụọ Nnamdi Kanu ijeri naịra ise iji tie ya aka n'obi.
Ha chọkwara ka gọọmentị rịọ Nnamdi Kanu mgbaghara n'ihu ọha, ma bipụta ya bụ mgbaghara n'akwụkwọ ntaakụkọ atọ a ma ama na Naịjirịa.













