Ipob news today: Ivan Sheehan dajọrọ n'ihe o dere maka Ipob na ESN - Ọkammụta Anthony Ejiofor

Otu Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi otu World Igbo Congress bụ Ọkammụta Anthony Ejiofor anọrọla n'akwụkwọ akụkọ 'Washington Times' katọọ ihe ọkammụta otu mahadum dị n'Amerịka bụ Ivan Sheehan dere maka Ipob.

N'ozi o wepụtara na "Washington Times" n'abalị anọ nke ọnwa Oktoba afọ 2021, Sheehan bụ ọkammụta na mahadum 'University of Baltimore' kwuru na o kwesịrị ka mba Amerika gụnye Ipob n'otu ndị na-eyi mmadụ egwu dịka ọ na-ebo ha ebubo aka ha ịdị na mkpamkpa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ ugbua.

Mana Ọkammụta Ejiofor sị na ya bụ ebubo nke ọ kpọrọ "okwu ụgha" nwere ike "itinye nde iri ise ndị Igbo na nsogbu."

N'ozi o dere n'Washington Times n'abali 13 nke ọnwa Oktoba, Ejiofor kwuru na "ihe Sheehan dere were ike ịja Gọọmenti Naijria ike ịga n'ihu n'ịkpagbu ndị etiti Naijiria na Ndida Anyawu,ndị ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Ụka Kraistị."

Ọkammụta Anthony Ejiofor

Ebe foto si, Anthony Ejiofor/Facebook

Ejiofor gara n'ihu boo Sheehan ebubo "na ọ na-achọ ikpuchi mkpochapụ agbụrụ nke Ndị Boko Haram na ndị Ọchịehi na-eme."

Ọ gọtaara otu Ipob sị na otu ahụ na-alụ ọgụ megide mmegbu na mkpagbu na-eme na Naijiria dịka ha na-agba mbọ maka referadum.

Aha onyonyo, Goddy Uwazurike

O kwuru na ikike ịchọ nnwereonwe nke ha na-achọ gbadoro ụkwụ n'mkpebi United Nation nke afọ 2007.

Ejiofor gọọtakwara otu ESN ndị Ipob hiwere sị na ọ bụ otu a malitere n'afọ 2020 iji chekwaba mwakpo ndị Igbo nke o boro ndị ọchịehi sị na ha na-atọrọ, na-edina n'ike ma na-ebibi ugbo.

Ọ sịrị na mba Amerịka ma maka mkpamkpa ndị a niile bu nke o kwuru mere ha jiri gba nkịtị ghara ịgụnye Ipob na Esn n'otu na-eyi ndụ egwu.

Ejiofor onye boro ebubo na ọ bụ gọọmentị Naijiria kwanyere Sheehan n'ihe o dere, kpọrọ ya oku ka o wepụ ihe o dere iji gbochie itinye ndụ ụmụ Igbo na nsogbu.

Amerịka kwesịrị ịgụnye otu Ipob na ndị 'Foreign Terrorist Organisation'- Ivan Sascha Sheehan

Otu Ipob

Ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimakor kwuburu na oku ọkammụta Amerika ahụ kpọrọ ka mba ahụ kpọpụta Ipob dịka otu oyiegwu maka ihe ọ kpọrọ "oke ogbugbu ndị uweojii na ndị nkịtị' 'uche aka ya'.

Onye ọkammụta mba Amerịka nke ihe gbsara 'Global Terrorism' doro anya bụ Ivan Sascha Sheehan kpọrọ Amerika oku ka ha gụnye otu Ipob n'otu na-eyi ndụ egwu(terrorist organisation).

Sheehan,onye bụ onyeisi ngalaba ihe gbasara mmekọrịta mba na ibe ya na mahadum 'University of Baltimore' dị n'Amerika, kporo oku ahụ n'ozi o dere n'akwụkwọ akụkọ 'Washington nke ụbọchị Monde(4/10/2021).

N'ozi ahụ, Sheehan onye gosiri mgbagwọju anya na ngalaba 'US Department of State' amapụtabeghị IPOB) dịka "otu na-eyi ndu egwu(Foreign Terrorist Organization (FTO) boro ebubeo Ma Ipob ma onye ndu otu ahụ emetala gbugbuo gbuo kwesịla ha Amerika kpọpụta aha ha.

Ihe Ivan Sheehan dere n'Washington Times

Ebe foto si, AFP

Ọ sịrị, "Na Nnamdi Kanu anaghị ezo nkwado ya nye iyi ndụ egwu bụ ihe na-atụ egwu. O kwuru na Biafra Redio na ya achọghị nnweta Biara n'ụzọ udo, na ọ bụrụ na ha enyeghị anyị Biafra na ha ga-anwụ."

"Nnamdi Kanu gozikwara na okwu ya abụghị okwu nkakịrị dịka n'ọnwa Disemba e kpughere otu Eastern Security Network (ESN) alaka ọgụ Ipob. Kemgbe ahụ, mwakpo ndị Ipob na-awakpo ndị uweojii na ndị nkịtị jiri site na pasent 59 rue 344."

Sheenan gara n'ihu boo otu Ipob ebubo iji iyi egwu na-agbawa ndị ọchịchị na ndị ọha mmadụ obodo aka ime ka ha chọrọ.

"N'ọnwa atọ mbụ n'afọ a, ha mere mwakpo karịrị 24 gunyere be gọvanọ ebe ha gburu mmadụ anọ nakwa ntọhapụ ndị omekome ruru 20,000."

O kwukwara sị, "Site na mmaja ha na-eme na Biafra Radio nakwa tigbuo-zogbuo ha na-agbawa ndị ndọọndọọ ọchịchị aka ime ihe ha chọrọ.

"Ha na-amanye ndị mmadụ nọrọ nụlọ kwa ụbọchị Monde iji kpachie akụnaụba mpaghara ahụ site ịgba ụgbọala njem ọkụ."

Aha onyonyo, Ihe mere mgbata Fani Kayode batara APC ji ewe m iwe - Joe Igboke

O kwuru na ịkpọpụta Ipob dịka otu na-eyi ndị mmadụ egwu ga-eme ka ụzọ ha si enweta ego kpọchie ma nye ohere ka gọọmentị Naijiria nwee ezi ohere iji busoo Boko Haram agha n'ụzọ zuru oke."

"E nyehala ha aha dịka otu na-eyi egwu, o nweghị ụlọọrụ maọbụ otu ọbụla ji dọla azụ ahịa ga-ekwe ka ha na ha nwee mmekọrịta."

Sheenan rụtụrụ aka mba Amerịka agụnyela ụfọdụ otu na-eti mkpu nwereonwe na mba ha dịka ETA nke mba Spain, otu Tamil Tigers nke mba Sri Lanka, nakwa otu PKK nke Turkey n'otu ndị oyiegwu maka iji ụzọ tigbuozọgbuo achọ ọchịchọ obi ha.

Ọ bụ akụkọ ụgha na Washington Times ewepụla ihe ha bipụtara maka Ipob

Nnyocha BBC gosiri na akụkọ ahụ ka dị ya

Ebe foto si, Screeenshot/BBC

Nnyocha BBC Igbo mere gisiri na akụkọ nke ọkammụta Ivan Sheehan dere gbasara otu Ipob ka dị n'igwe ozi ụlọ ntaakụkọ Washington Times.

Nke a na-abịa dịka otụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ụlọ ntakụkọ ahụ ewepula ya bụ akụkọ ha dere na-akpọ gọọmentị mba Amerịka oku ka ha kpọọ Ipob "otu na-eyi ndụ egwu".

Ha bokwara ebubo na akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha .

Akụkọ ndị ga-amasị gị: