Agbaala ụlọ Joe Igbokwe ọkụ na Nnewi

Igbokwe na ụlọ ya gbara ọkụ

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook

Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na agbaala ụlọ Joe Igbokwe ọkụ na Nnewi.

Igbokwe na onwe ya depụtara nke a n'akara Facebook ya ma na-ekele Chukwu na o nweghi ndụ furu n'ọdachị ahụ.

Kepu kepu na-ekwu kwa na agbara ụfọdụ ụlọọrụ ndị nchekwa ọkụ na Nnewi ahụ kwa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenganyia gwara BBC Igbo n'ozi ekwentị na ọ bụ ezie na ihe a mere.

O kwukwara na dịka ọ dị ugbua ndị uweojii na ndị agha agaala ebe ahụ ma dopu ya iche maka nnyocha.

N'ọnụ ya "Ọ bụ n'elekere abụọ nke ehihie ụbọchị ụka ka akpọrọ anyị bụ ndị uweojii oku enyemaka na Nnewi"

Cheta na Joe Igbokwe na-eti mkpu ndụ ya n'aka otu Ipob ọnwa ole na ole gara aga.