Chike Akunyili Dora Akunyili's Husband: Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ odogwu nwoke a

Chike Akunyili

Ọ bụ eziokwu na Dkt Chike Akunyili alaala ịga zuru ike, mana ike ọ kpara oge ọ dị ndụ, ga-adigide.

Chike Akunyili lara mmụọ oge ndị ekperima zutere ụgbọala ya n'ụbọchị Tuzde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Sepụtemba afọ 2021.

Ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ndụ Dkt Chike Akunyili

  • Chike Akunyili bụ onye Agulu, n'Anambra State
  • Ọ bụ dibia bekee a ma ama na Naịjirịa nakwa na mba ụwa.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụka
Ezinụlọ

Ebe foto si, Chidiogo Akunyili

  • Ọ bụ na Mahadum Nsuka ka o zutere Dora nwunye ya, onye nọkwa ọzụzụ maka ịbụ 'pharmacist'
  • Chike na Dọra Akunyili mụrụ ụmụ isii: Ijeoma, Edozie, Somto, Njideka, Chidiogo, na Obumneme
  • Atọ n'ime ụmụ ya isii bụcha dịbia bekee
  • Ọ bụ Chike Akunyili nwe ụlọọrụ redio Solid Fm, Enugu
  • Ọ bụkwa ya hibere ụlọọgwụ 'St. Leo's Hospital', Enugu

Etu ndị ojiegbe siri gbuo Dr Chike Akunyili, di Dora Akunyili

Dr Chike Akunyili
Nkọwa foto, Dr Chike Akunyili

Dọkịta Chike Akunyili, di Dora Akunyili, alaala mmụọ.

Ọkammụta Akunyili zutere ọnwụ ya n'aka ndị ekperima amaghị ndị ha bụ n'ụbọchị Tuzde.

Aha onyonyo, Dora Akunyili: Aka m na-ahụ nwunye m na nrọ

Etu ndị ekperima si gbuo nna m - Obum Akunyili

Obum Akunyili, nwa Dkt Chike Akunyili gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'eziokwu.

O kwuru na ọ bụ oge nna ya si Enugwu alọta ka ha zutere ndị ojiegbe n'ụzọ.

Obum kwuru sị: "Nnam gara Enugwu n'ụbọchị Tuzde ka ọ ga nata nkwanye ugwu nke e nyere nne m larala mmụọ."

"Ọ bụ oge ha na-alọta ka ha hụrụ ndị ekperima bucha egbe kwụrụ n'ụzọ."

"Ndị uweojii hụrụ ha yipuru akwa ha gbabaa n'ime ọhịa."

"Oge ha hụrụ nna m, ha malitere iti mkpu na-asị na ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị (politician)."

"Ha gbara nna m egbe n'isi. Gbukwaa onye na-akwọrọ ya ụgbọala, nakwa onye uweojii na-eche ya nche."

"O nwekwara otu nwa nwanne nna m nọ n'ụgbọala ahụ, ha gbara ya egbe mana ọ nwụghị."

Obum kwuru na ya bụ ihe etinyela ezinụlọ ha na nnukwu ihe iru uju.