Ipob Emergency Prayer for Nnamdi Kanu: Lee ka ụbọchị ekpere otu a si gaa n'ala Igbo

Ahia Abakpa dị n'Enugu
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na agagharị na Texaco bus stop Abakpa Nike, Enugu n'ụtụtụ Tuzde

Site aka na ntị Ipob dọrọ maka ịnọ n'ụlọ ndị otu ha n'ala Igbo taa bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Nọvemba 2021, otu a ka o siri gbata kwuru na ọnwụnwa anyanwu taa.

Anambra steetiBBC Igbo hụrụ na ahịa ukwu nke Ọnịcha bụ "Onitsha Main Market" emepeghị ka ọ kụrụ elekere asatọ nke ụtụtụ taa.

Ugbọala ndị njem apụtaghịkwa ohe ahụ, naanị na ntụnye na ntụnye ka anyị hụrụ ụgbọala ndị mmadụ nke gosiri na ndị bi n'Ọnịcha kwanyere ozi a ugwu.

Akwa mmiri

Ebe foto si, Getty Images

N'Abia steetiBBC Igbo gaghaghariri na isi obodo Abịa steeti bụ Ụmụahịa ebe ndị mmadụ nọ n'okporo aga mkpa ha.

Ọtụtụ ụgbọala nọ n'ụzọ.

Agbanyeghi nke a, ụgbọala ndị njem anọghị n'ọrụ dịka ndị mmadụ pụtara ime njem n'ụtụtụ Tuzde mana ha ahụghị ụgbọala ga-ebuga ha mkpa ha.

Etu Ọka dị n'ụtụtụ taa
Nkọwa foto, AWKA

Cheta na otu onye n'ime ndị ndu otu Indigenous people of Biafra (Ipob) bụ Chike Edozie zipụtara ozi kwuo ka ndị otu ha na ndị Igbo niile mechie ụlọahịa ha n'ụbọchị Tuzde maka ekpere n'isi onye ndụ ha bụ Maazị Nnamdi Kanu.

Akwụkwọ ozi ya kwukwara ka ekpere nke ụbọchị Tuzde bụ ụbọchị 30 nke ọnwa Nọvemba hibe isi na nchekwa udo na ịdịnotu n'ala Igbo, o kwukwara ka ndị mmadụ kpee ekpere maka ịtọhapụ onyendu ha bụ Nnamdi Kanu e ji eji.

Na ngwụcha, ọ riọkwara ndị mmadụ ka ha kpee ekpere maka mwereonwe ndị Igbo dị ire.

Maazị Edozie depụtakwara ka ụlọakụ niile no n'ala Igbo hapụ imepee taa bụ ụbọchị Tuzde maka ekpere a ha hibere. Ọ kpọkuru ndị ụkọchụkwụ, ndị amụma, ndị ụkọchụkwụ okpukperechị ndị Jụụ, ndị Ọdịnana, ndị Eze nakwa ndị Igwe maka ekpere a.

Nchọpụta anyị mere na-egosi na agbanyeghị na ndị mmadụ na-agagharị mana ụgbọala ndị njem anọchaghị n'ụzọ.

Anyị ga-akapịara gị ya ọnụ mgbe anyị chọpụtara ihe mere.

Aba na Onitsha bụ naanị ebe 'sit at home' kpụ ọkụ n'ọnụ ebe Enugu, Owerri, Awka na ebe ndị ọzọ emepewela - 20-9-2021

Owerri
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọahịa mepere taa n'Owere

Taa bụ ụbọchị Mọnde nke gara aga (27-9-2021) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, bụ ụbọchị ndị mmadụ ejighi apụ iro n'ihi egwu ndị omekome.

Cheta na ndị otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) tinyeburu iwu mmachị mkpagharị kwa Mọnde ọbụla iji gosi iwe ha maka nnwuchi onyeisi ha bụ Mazi Nnamdi Kanu.

Mana ọ bụ eziokwu na ha akagbuola ya bụ atụmatụ ugbua, ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta ezi ụbọchị Mọnde ọbụla.

N'ọdị nso a, gọọmentị steeti dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agwala ndị mmadụ ka ha na-aga mkpa ha ụbọchị Mọnde, mana okwu ha amịtabeghị mkpụrụ.

Na Mọnde nke taa, ihe BBC Igbo na-ahụ gosiri na ya bụ 'sit-at-home' ka nwere ike inwe isi.

Onitsha

Ụlọahịa agbachiri agbachi
Nkọwa foto, Onyonyo a abụghị nke taa, kama e ji ya kọwaa akụkọ

Ahịa niile dị n'Ọnịcha mechiri emechi dịka ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ siri kwuo.

Ma 'Main market', ọchanja, 'head bridge', ahịa 'relief', mgbuka Obosi, mgbuka Nkpor, ha ncha azụghị ahịa taa.

Naanị ụlọahịa ndị nọ n'ime ogbe ji nwayọ mepee ma na-achagharịkwa anya maka adịghị ama ama.

Onitsha

Otu onye achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ọdachi mere na mpaghara Ukaegbu n'Awada n'ụbọchị Sọnde so tinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ.

Ndị ojiegbe gbagburu ndị uweojii ma gbakwaa ụgbọala ha ọkụ na mpaghara ahụ.

Aba

BBC chọpụtakwara na nnukwu ahị niile dị n'Aba enweghị nke mepere.

Ma Ariaria, Enyimba, Ngwa Road, ha ncha gbachiri agbachi.

Otu onye gwara BBC Igbo na ndị ntorobịa n'agba bọọlụ n'okporo ụzọ Ngwa 'road'.

Enugwu

Ahịa Ọgbete Enugwu
Nkọwa foto, Ahịa Ọgbete Enugwu

Onye ntaakụkọ anyị kpagharịrị n'ahịa Ogbete Enugwu hụrụ na ndị mmadụ mepere ntakịrị karịa etu o si adịbu na Mọnde ndị ọzọ gara aga.

mana ihe dị iche dị, n'ihi na ọtụtụ ụgbọala na-agba, ndị mmadụ na-akpagharịkwa na-enweghị mgbochi ọbụla.

Owerri

Owerri - Okigwe Road
Nkọwa foto, Owerri - Okigwe Road n'ụtụtụ sit at home Mọnde 20 Septemba

BBC Igbo chọpụtara na ndị mmadụ na-akpagharị obere obere na mpaghara Owerri- Okigwe Road n'ụtụtụ Mọnde a.

Ụfọdụ ụlọahịa ndị mmadụ mepekwara emepe, mana ọ bụghị onye ọbụla pụtara ezi.

Mana onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ụlọakwụkwọ mechiri emechi, ebe ụlọakụ dị n'Owere na-arụ ọrụ obere obere.

Aladinma, Owerri
Nkọwa foto, 'Sit-at-home' emeghị taata na mpaghara Aladimma, Owerri

Na mpaghara Aladinma, anyị chọpụtakwara na ndị mmadụ na-akpagharị nke ọma.

Ụgbọala ndị mmadụ nọ n'ụzọ na-agara mkpa ha.

Nke a pụtara na ya bụ 'sit-at-home' anaghị enwe isi, ka ọ dị ugbua, n'Owere, isi obodo Imo steeti.

Ikenegbu, Owere
Nkọwa foto, Ka ụzọ Ikenegbu, n'Owere, ndị mmadụ na-aga mkpa ha
Wetheral Road, Owere
Nkọwa foto, Wetheral Road, Owere, ndị mmadụ na-aga mkpa ha

N'Awka

BBC chọpụtakwara na ndị mmadụ na-akpagharị.

Na mpaghara Regina Junction dị n'Awka, ụgbọala na-akpagharị nke ọma, ọtụtụ mmadụ pụtakwara, ebe ndị ahịa na-erekwa.

Nke a pụtakwara na 'sit-at-home' enweghị isi n'Awka taa.

Oge onye ntaakụkọ anyị garuru mpaghara Eke Awka, anyị hụkwara na ọtụtụ ụgbọala na-akpagharị, mana ụlọahịa ndị mmaọ̄ụ kpọchiri akpọchi.

Mana anyị chọpụtara na ụfọdụ mepere.

Cheta na Gọvanọ Willie Obiano kwere nkwa na ndị ọrụ nchekwa ga-anọ iji chekwaa ndị mmadụ.

N'ụbọchị Satọde, ọtụtụ ndị mmadụ kpagharịrị n'ahịa dị icheiche na-eke akwụkwọ iji kọwaara ndị mmadụ na IPOB akwụsịla atụmatụ ịnọ n'ụlọ.

Onye ntaakụkọ BBC kwukwara na ụfọdụ ụlọụka mara ọkwa ka ndị mmadụ gara mkpa ha n'ụbọchị Mọnde.

N'Abakiliki

Abakiliki
Nkọwa foto, Abakiliki taa bụ Mọnde

Onye BBC kpagharịrị na Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti, chọpụtara na ọtụtụ ụgbọala nakwa keke nọ n'ụzọ.

Na mpaghara Ogoja 'road', ndị mmadụ na-akpagharị nke ọma na-enweghị mgbochi ọbụla.

Mana ọtụtụ ụlọahịa emepeghị dịka o si adịbu.

Mana ụmụaka anyị hụrụ na-aga akwụkwọ ebughị ibu.

Abakiliki
Abakiliki
Abakiliki
Abakiliki

Lee ụfọdụ ihe merela nke tinyere ụjọ n'ime ndị mmadụ:

Aha onyonyo, Ihe ise ga-akwụsị sit-at-home a Ipob na-eme – Elliot Uko

N'ụbọchị Sọnde, abalị iri na itoolu nke Sepụtemba 2021, akụkọ kwuru na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ gbagburu otu onye uweoji na mpaghara Awada, Obosi, Anambra Steeti.

Ọ bụ n'ogbe a na-akpọ Ukaegbu ka ya bụ ihe mere nke butere nnukwu ụjọ.

N'ihi nke a, ọtụtụ ekwuola na ụkwụ ha agaghị apụta ezi n'ụbọchị Mọnde, maka na ejighi ihe e ji agba na ntị agba na anya.

Dịka ụbọchị na-aga, BBC Igbo ga na-ewetara gị etu ọnọdụ si dịrị na Steeti dị icheiche.

Cheta na n'Enugu n'ụbọchị Sọnde - Septemba 19, 2021

Akụkọ kwukwara na ndị ntorobịa kwuru na ha bụ ndị Biafra wakporo ọgbakọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara Enugwu West n'ụbọchị Sọnde.

Ha chụsasịrị ndị nọ n'ọgbakọ ahụ, ma mekwaa ndị ọzọ akaje.

Dịka akụkọ siri kwuo, ndị ntorobịa ahụ kwuru na agaghị enwe ihe ọbụla dị ka ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'afọ 2023.

Akụkọ ka na-abịa.