Unknown gunmen attack in Anambra: Lee mkpamkpa ndị ojiegbe kpara n'Anambra steeti na Sept 28

Ebe foto si, Onye achọghí ka akpó aha ya
Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola ndị amabeghị ọnụọgụgụ ha ma gbakwa ụfọdụ ụgbọala ọkụ n'Oko nakwa Nkpọ, n'Anambra steeti na mgbede Tuzde.
Otu onye bi n'Oko nọ ebe ihe mere achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na ndị ndi mmadu ụgbọala abụọ, wakporo notu nwoke amabeghị onye ọ bụ bu ụgbọala pati n'ihu Total Petrol Station dị na Tipper Road gbaa ya egbe ma zuo ụgbọala ya ọkụ.
"Ha bụ ụgbọala abụọ; otu Siena nakwa ụgbọala Lexus dị ọcha, tipụta chụrụ ụgbọala ndị otu pati.
Ha kpụpụtara ọkwọụgbọala ahụ gbaa ya egbe n'ụkwụ abụọ ma zunye ụgbọala ya ọkụ."
Ya bụ ihe mere mere ọsọ suru dịka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ ha.
Ndị ji egbe wakpokwara nso Afọ Nkpọ, dịkwa na Anambara steeti ma gbuo mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha.
Di Dora Akunyili bụ Dkta Chike Akunyili so na onye mwakpo ahụ tara isi ya.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ kpụpụtara Dkta Akụnyili n'ụgbọala ya gbagbuo ya, gbagbu ọkwọụgbọala ya na otu onye uweojii so ha.
Ha gbakwara nwa nwanne ya so ya na ụgbọala ahụ egbe mana ọ nwụghị.
Akụkọ kwuru na Dkta Akunyili gaara mmemme nturuugo nke ndị gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nyere nwunye ya.
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii na steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga azaghị ekwentị ya nke ọ na-asa ozi anyị zigara ya n'ekentị ya oge akụkọ pụtara.












