Benefits of Bitter Leaf: Etu m si malite ịkọpụta olugbo ebe o buru ibu - Elochukwu Anozie

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Etu m si malite ubi olugbo m - Elochukwu Anozie

Elochukwu Anozie bụ onye nwere ugbo ebe ọ na-akọ naanị olugbu akọwaarala BBC Igbo etu o si malite.

Anozie kwuru na ọ gụkwara akwụkwọ mana ọ gụchaghị tupu ọ banye ịkọ olugbu bụ ebe o si akpa nri ugbua.

Ọ kọwakwara usoro e ji akọ nakwa elekọta ya anya.

O kwuru na ọ ga-amasị ya ma olugbu ọ na-akọ gatee aka ma gazuo ụwa.