Yam Farming: Lee ihe mere ịkọ ji n'akpa ji dị mma karịa ịkọ ya n'ala

Aha onyonyo, Ọgba mbọ yam in bag farmer: Lee ihe mere ịkọ ji n'akpa ji dị mma karịa ịkọ n'ala
Nwoke na-akọ ji n'akpa

Sunday Obi-Chukwu, onye ọrụ ugbo kọwara ka o sị malite ịkọ ji n'akpa nakwa ihe mere oji na-akọ ya n'akpa karịa n'ala.

Na njem BBC Igbo mere n'ọrụ ugbo ya, o mere ka a mata na ịkọ ji n'akpa n-enye aka ịkọpụta ọtụtụ ji n'okeala karịa mgbe a kọrọ ya n'ala.

Ọ sị na ihe mere o jiri malite ya bụ n'ihi oke nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na Naịjirịa nke buterela ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

Obi-Chukwu sị na uru ọzọ dịka n'ịkọ ji n'akpa bụ na ọ naghị abọchasị ahịhịa ọbụla mana ị kọọ ji n'ala na ị ga na-abọchasị ahịhịa kwa mgbe.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo