Ekene Obayi: "Abụ m nwaanyị Igbo na-achị ehi mana ihere anaghị eme m"

Aha onyonyo, Ogba mbọ: 'A bụ m ọchịehi nwaanyị ji ọrụ m akpa nganga'

Ekene Obayi bụ nwaanyị ji ịchị ehi mere aka ọrụ na Nsukka dị n'Enugwu Steeti.

Ọ hapụrụ asambodo o nwetere na Mahadum dịka onye nchọpụta ihe ọkpụ Bekee kpọrọ 'Archeology' wee chịwazie ehi.

Ugbua Ekene sị na ya na-achọ ego ọ ga-eji zụta ala ebe ọ ga-eji rụọ ogige ụmụanụ bụ ebe ọ ga-ewe ụmụnwaanyị ibe ya n'ọrụ.

Ọ sị na ọ kwadoghi ịchagharị ehi n'ụgbo ndị mmadụ bụ nke na-ebute nsogbu n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo.

Ọ gwara BBC otu o sị chọọ ịgbanwe ajọ echichi ndị mmadụ gbasara ọrụ ịchị ehi na Naịjirịa.

Ndị mere ihe onyonyo: Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo