Ọgbambọ: 'O nweghi onye sị na ihe nwoke ga-eme nwaanyị agaghị emenwu ya' - Nwaagbaghọ na-ama 'tile'

Aha onyonyo, Nwaanyị na-ama 'tile'

Cynthia Ejike bụ nwata nwaanyị na-arụ ọrụ bu nke ụmụnwoke na-arụkarị.

Ọ gụrụ "Chemical Engineering" na mahadum IMT dị n'Enugwu mana ọ sị na ya kpebiri ịrụ ọrụ dịka onye na-ama "tile" n'ụlọ.

N'ihe onyonyo a, o kwuru etu mmasi ọrụ a jiri mee ka ọ na-edi ntarama ahụhụ dị n'ọrụ a ọ na-arụ.

Ọ bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ