Igbo cuisine: Ana m amalite ọrụ n'elekere atọ nke ụtụtụ - Onye Abacha
Ndị na-atụ mgbere n'ahịa Ladipo ma Grace Igwe dịka onye na-ere abacha.
Mana ọ bụghị sọsọ ihe nwaagbọghọ ahụ na-eme.
Nwa ada Igwe sị na olileanya ya bụ ịgụ egwu, ma gakwaa mahadum ga mụọ atụmatụ egwu.
Iji mezuo ihe a, ọ na-ere abacha iji kpata ego.
Ọ sị na nne na nna ya na-akwado ya ọfụma.
O kwukwara na agbanyeghị na ụmụnwoke na-enye ya nsogbu, uche ya dị n'ihe ọ chọrọ bụ ịbarụ onwe ya uru.
Kirie ihe onyonyo a ka ị mata ya n'uju: