Dr Onye Mmemme: Ọ na-afụ ụfụ n'ahụ mana ọ na-enye m ọṅụ - Ote egwu
"Ndụ a anyị na-ebi pere mpe, mana ọ bụ egwu ka m ji aka".
Nwafọ Igbo bụ Nnaemeka Nweke kwuru nke a iji kọwa ịhe mere o ji tikwasa ịgba egwu na ọrụ dọkịnta bekee ọ na-arụ.
O kwukwara na ọ naghị agba ya na nkịtị makana ndị mmadụ na-akwụ ya ezigbo ụgwọ ka ọ gba egwu na mmemme ha.

