Ọgba Mbọ: Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya na m banyere n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ - Ifeoma Chidebe
Ifeoma Chidebe bụ nwaagbọghọ nwere mmasị n'ịrụ ọrụ aka kọwara etu o si banye n'ịrụ akpụkpọụkwụ karịa ịrụ ọrụ Bekee.
Nwaada a kwuru etu ndị mmadụ si wee na-ajụ ya ma "uche ya adịkwa ya" dịka ọ gwara ha na ọ chọrọ ịga mụọ ya bụ akaọrụ.
Ma kwuo etu o si gụchaa mahadum tupu ọ banye n'ọrụ a, ma kwuo na ọ bụ kemgbe ọ dị na nwata ka o jiri malite inwe mmasị maka ihe o ji aka ya rụpụta.
Ọ kọwara na olileanya ya bụ ịgaru mba Itali bụ ebe a ma ama maka iji ezigbo akpụkpọanụ arụpụta akpụkpọụkwụ na ihe ndị ọzọ.
O kwukwara na o nwere olileanya inwe nnukwu ebe nrụpụta ọrụ nke Bekee kpọrọ 'Factory' n'ọdịnihu.
Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo