Ọgba Mbọ: Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya na m banyere n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ - Ifeoma Chidebe

Aha onyonyo, Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya na m banyere n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ - Ifeoma Chidebe

Ifeoma Chidebe bụ nwaagbọghọ nwere mmasị n'ịrụ ọrụ aka kọwara etu o si banye n'ịrụ akpụkpọụkwụ karịa ịrụ ọrụ Bekee.

Nwaada a kwuru etu ndị mmadụ si wee na-ajụ ya ma "uche ya adịkwa ya" dịka ọ gwara ha na ọ chọrọ ịga mụọ ya bụ akaọrụ.

Ma kwuo etu o si gụchaa mahadum tupu ọ banye n'ọrụ a, ma kwuo na ọ bụ kemgbe ọ dị na nwata ka o jiri malite inwe mmasị maka ihe o ji aka ya rụpụta.

Ọ kọwara na olileanya ya bụ ịgaru mba Itali bụ ebe a ma ama maka iji ezigbo akpụkpọanụ arụpụta akpụkpọụkwụ na ihe ndị ọzọ.

O kwukwara na o nwere olileanya inwe nnukwu ebe nrụpụta ọrụ nke Bekee kpọrọ 'Factory' n'ọdịnihu.

Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo