Female DJ: Ime 'DJ' akpọgala m ebe m na-arọghị nrọ ịgaru - DJ Wysei

Aha onyonyo, Ị bụ nwaanyị bụrụkwa DJ adịghị mfe chaa chaa

Ịgwọkọ egwu nke Bekee kpọrọ Disc Jockey maọbụ DJ n'aha ịchafụ, abụghị ọrụ dị mfe.

Na Naịjirịa, ọ bụ ọrụ ụmụnwoke na-arụkarị.

Mana nwaada Igbo, Ebere Iwuagwu, onye e ji DJ Wysei mara, egosila na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwere ike ime ya karịa.

Iwuagwu, onye rụrụ n'ụlọọrụ redio, 'Wazobia FM dị na Legọs, malitere ịgwọkọ egwu oge ọ dị afọ iri na asaa.

Ugbua onye ọbụla ekwetala na ya bụ nwaada ma ihe ọ na-eme.

Gere akụkọ ya n'ihe onyonyo dị n'elu.

Ndị mere ya bụ Uche Akolisa na Nnamdị Agbanelo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: