"Amụghị m ịma mbem amụ, ebu m ya pụta ụwa"

Aha onyonyo, Onye ọma mbem

Ịma mbem so na ihe dị ezigbo mkpa n'omenala Igbo, mana ọ bụ ndị okenye na-emekarị ya n'ihi na ihe dị na ya dị ukwu.

Ọ bụ ihe ịtụ n'anya ma dịkwa ezi ụtọ n'obi ịhụ nwata dị afọ 24 ebe ọ na-ama mbem ma na-emeta ya nke ọma.

BBC Igbo jụrụ nwata a bụ Igwe Credo etu o siri malite ya bụ aka ọrụ bụ nke ndị okenye, mana o kwuru na ụwa ya lọrọ mere ya ji ama mbem.

Ya bụ okwu ka ụtọ n'ọnụ ya. Gere ya ebe a:

Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo

Akụkọ ndị a ga-amasị gị: