Igbo Artefacts: Ụfọdụ akpụrakpụ ndị ọcha na-ere bụ nke e zuru n'ohi'
N'agbanyeghị na ọkammụta a ma ama banyere nka bụ Chika Okeke-Agulu na-akpọ oku ka ụlọ ahịa nka Christie's ghara ire akpụrakpụ mụọ abụọ si ala Igbo, ha nwereike ree ha taa.
Ọkammụta Okeke-Agulu gwara BBC na ọ bụ 'ohi' ka e zuru akpụrakpụ abụọ a n'oge agha Biafra.
Christie's gọrọ ụkwụ na aka sị na orire ihe ndị ahụ kwụ ọtọ.
A na-ele anya na nka ndị a ga-erite ihe si $280,000 ruo $390,000.
Nka abụọ bụ osisi ka eji tụọ ha ma bụrụ mụọ nwoke na nwaanyị.
Ha nọ dịka ha achọrọ ịnata aja na onyinye.

Ebe foto si, chikaokeke-agulu.blogspot.com
Ọkammụta Okeke-Agulu si mahadum Princeton si na ọ bụ n'ụlọ alụsị dị na Anambara steeti ka ndị ọcha na ndị obodo so ha eme si zuru mụọ ndị a.
Ọ sị na dịka ọ bu n'oge agha Biafra ka ezuru mụọ ndị a, onweghị ka ọ ga abụ eziokwu na ha nwetere ya n'ụzọ ziri ezi.
Ọ kwenyere na nka ndị so n'ihe Igbo jiri bụrụ Igbonke kwesiri ịbụ ihe ga-adịrị ndị na-abịa n'ihu.
Ọ bụ n'elekere otu nke ehihe n'ụbọchị Monday bụ nke 29 n'onwa ka Christie's ga-amalite ire mụọ abụọ.
Kedụ ihe Christie's na-ekwu?
N'akwụkwọ mgbasaozi ụlọ ahịa nka Christie's wepụtere, ha sị: "Onweghị oge anyị nwetere kepukepụ ọbula na esi ụzọ ezighi ezi bụbata ihe ndị a."
Dịka ha sị kwuo, ọ bụ otu nwa afọ Frans aha ya bụ Jacques Kerchache, bụ onye na-ebute nka, gotere mụọ abụọ a.

Ebe foto si, Christies
Christie's sị: "Onweghị akaebe na ọ bụghị onye obodo nka ndị a so si ebe ahu wepute ha,"
Ha sịkwa na onweghi akaebe na agha na-ada ebe e si bute nka ndị ahụ.
Ihe ndị ọkammụta ndị ọzọ n'ekwu
Ọkammụta Clifford Nwanna bụ onyeisi ụlọakwụkwọ gburugburu na mahadum Nnamdi Azikiwe sị na ọ ga-arịa ahu ịchọpụta ma ọ bu ohi maobu n'ụzọ kwụ ọtọ ka esi buru mụọ ndị a.
"Ekwesiri ime nchọpụta banyere ya makana ọtụ ihe a na-abụ ihe e goro dịka nka. Ọ bụ onye nwetere ya mbụ ga-ama etu o si nwete ya. N'oge mbụ, onwere ka alụsị agaghị adị ire eburu ya tufuo. Igbo na asị 'ikenga adịghị gị ire, ị waa ya nkụ'.
"Ihe na-ewu bụ ibo ya ndị ọcha, si na ọ bụ ha zuru ha ncha. Mana ụfọdụ bu anyị tufuru ha, ụfọdụ bụ ndị bara ụka na atụfu ha. Onweghi ihe ndi be anyi na-eji ihe ndị a eme."
Ihe Okeke-Agulu ga-eme bụ inyocha akwụkwọ ndị ọcha ji banyere nka ndị a. Onwere ike rere ya o nwete usoro e si ree ha."

Ebe foto si, Christies
N'otu aka ahụ, Ọkammụta Ochefu bụ onyeisi mahadum steeti Taraba sị na adịghi eso iwu manyere na ndi ọkammuta banyere nka ga-anọ ebe ọbụla a na-egwu ala na Naijirịa.
"Ihe na-eme bụ na ndi mmadụ - ọkachasị ndị na-arụ ọrụ ụlọ maọbụ ụzọ - ga-egwupute nka ma buru ya ga ree na ofesi. "
Ọ gakwara n'ihu sị na ụdịrị ihe malitere kemgbe ndi ọcha bịara Naịjirịa.
"Ha buru nka na Bini, nke a na-akpọ "Benin Bronze. Ọ bụ bụ na azụ ka a na-ere nka ndị a mana ugbua a na-erezi ha na ihu ahịa dịka ụlọ nka na ebe ndị ọzọ."
Ọ sị na ọ bụ ndị ọcha nna ha maọbụ nne ha buru nka ndi siir Naịjirịa pụo na irite uru ha ugbua.
Ọkammụta Ochefu sị na usoro na-echekwa nka na ihe ndị ọzọ diri obodo maọbụ ofufe mpka adịghị iri ma ncha.
Kemgbe mkpu oke agbụru na ngaghari iwe "Black Lives Matter" nwuru ọkụ, uche ndị mmadụ na-agazị n'ụdịrị okwu, dịka a na-eche na ọbụghị ụzọ ziri ezi ka eji buru ọtụtụ n'ime nka ndị a.
Ihe karịrị mmadụ 2000 ebinyela aka n'okwu n'akpọ ka akagbuo oriri nka abụọ a.













