Sacred Trees: Osisi ndị dị mkpa n'Igbo oge gboo na ihe omimi so ha

Osisi Ogilisi
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

N'ala Igbo, ihe niile ekere eke ọbụladị osisi nwere ihe omimi ha na-egosi maọbụ ozi e ji ya ezi.

Dịka ilu Igbo siri kwuo, a tụọlụ ọmalụ, ọ malụ, a tụọlụ ofeke, o fenye isi n'ọhịa.

Naanị ndị ma ihe omimi dị n' osisi nwere ike ịghọta ozi e ji ya ezi na ihe dị n'ime ya.

Aha onyonyo, Pete Edochie gọrọ BBC Igbo ọjị

N'omenala Igbo, nkwenye ndị gboo bụ na osisi ọbụla nwere ike so ya,. ya mmere na ọtụtụ mgbe a mụọ nwa ọhụrụ, e lie ọ́lụlọ nwa ya n'okpuru osisi.

lee ụfọdụ osisi nwere ugwu na ọnọdụ pụrụ iche n'ala Igbo:

Ọjị

Ukwu ọjị

Ebe foto si, George Agiri

Ọjị bụ oke osisi n'ala Igbo. E ji ya arụ ụlọ ewu na atụrụ na-ata akwụkwọ ya dịka nri.

Mana ihe kachasị nke bụ ihe omimi so ya. A na-eji ya atụnyere ihe dị ebube, ihe maọbụ onye nwere agba.

Dịka ilu Igbo siri kwuo,onye rịrị ọjị kpaara ya nkụ n'ihi na anaghị arị ọjị kwa daa.

Nke a bụ iji kọwaa ugwu ọjị nwere n'ala Igbo.

Akwụkwo ọjị

Ezenka Morris Udochukwu Agbarakwe bụ onye ihe omenala Igbioo doro anya kọwara na ọjị bụ "nnukwu osisi e nwere n'ala Igbo a na-akwanyere ugwu n'ala Igbo."

"Ihe gbasara mụọ na mmadụ nọ n'ukwu ọji."

Ọ kọwara na a na-achụ ajadị iche iche tupu e gbutuo ọjị gbarala mgbọrọgwụ.

Osisi anụnụebe

Ọtụtụ ndị mmadụ na-anụ ụdụ osisi a mana ha ahụbeghị ya anya.

Dịka Agbarakwe sị kọwaa, osisi ahụ anaghị enwe osisi kwudebere ya.

Nnụnụ na ụmụanụmanụ anaghị ebekwa sị ya, ha bekwasị ya, ha anwụọ.

Naanị ndị katara ahụ na-eji ya eme ihe.

Agbarakwe sị, "A na-eji ya eme ihe siri ike. E ji ya eme ihe mmụọ."

"Ndị katara ahụ ma ihe e ji ya eme ma jirikwa ya eme ihe ha ji ya eme."

Ogilisi

Ogilisi

Ebe foto si, Nonso Akosa

Ogilisi bụ osisi ndị sayensi na-akpọ 'newbouldia laevis.'

Osisi ogilisi bụ anwụanwụ; ma ọkọchị ma udummiri akwụ ya anaghị agha ndụndụ chawa ihe ọzọ.

A na-eji ya agba ogige ụfọdụ ji ya emeta ọba ji.

Ichie Morris Agbarakwe kọwara na,"A na-eji ya eme oke ala. A na-etunye ya ebe e liri mmadụ iji rụba ebe ahụ ama."

"Mgbe gboo, ndị na-agọ mụọ, ndị na-ebute arụsị na eji ogilisi akwadobe ụdị ihe ahụ."

Agbarakwe gara n'ihu sị na, "A na-eji ogilisi eme ihe siri ike."

Ụfọdụ obodo n'ala Igbo na-eji ogilisi esi ozi.

Ịma atụ: Agbọghọ lụrụ di ọhụrụ gaa 'ife ụlọ' be di ya, ọ lawa, a na-ebunye ya ite manya o ga-eji ekele ndị ọgọ mana e tinye akwụkwọ ogilisi n'ọnụ ite mmanya ahụ ihe ọ pụtara bụ "anyị alụkwaghị "

Nkwụ

Osisi nkwụ

Ebe foto si, George Agiri

O nweghị ihe nọ na nkwụ lara n'iyi; ewu na atụrụ na-eri igu; e ji ihe ewu rifọrọ igu mere azịza; e ji akwụ emeta mmanụ; akụ emeta ude;abụbọ bụ ihe e ji emenwu ọkụ.

A na-etetakwa nkwụ a na-aṅụ aṅụ na nkwụ.

Mana ọ bụghị naanị ihe na-enye ego dị na nkwụ, ọmụ nkwụ nwere ihe omimi so ya.

E tunye ọmụ n'ubi, ihe ọ pụtara bụ mmadụ abala ya.

E jikwa ọmụ eti mmanwụ, e ji ọmụ egosi ebe mmadụ nwụrụ.

Ọmụ nkwụ

Agbarakwe sị, "Ebe a na-azọ ala, e tunye ọmụ n'ala, ihe ọ pụtara mmadụ abala ya rue oge a ga-ekpesi ikpe ala ahụ."

"Onye banye n'ala ahụ, ọ bụrụ na be anyị ndị obodo ga-eri gị iwu."

Dịka Agbarakwe sị kọwaa, e turu ọmụ n'ọnụ ọ pụtara na onye tu ya agaghị ekwu okwu, gịnwa agwakwala ya okwu.

Ọgbụ

Osisi ọgbụ so na osisi ndị Igbo na-akwanyere ugwu pụrụ iche.

Ndị na-efe arụsị na-egbupuru arụsị ha ọbara maọbụ nwụpụrụ ya mmanya n'ukwu ọgbụ.

Agbarakwe kọwara na ihe mere nke a bụ n'ihi nkwenye ndị gboo na "o nwere ihe gbasara ọgbụ na ndị mụọ na mmadụ, ya mere ndị gboo ji awụpụrụ ya ọbara."

Ụdara

Ụdara

Ebe foto si, George Agiri

Nkọwa foto, Osisi ụdara

Ụdara bụ otu osisi mmadụ ga-enwe n'ugbo ya, ọ gaghị a bụ nke ya, ọ bụrụ nke ọha.; ọnye ọ dara , ọ rachaa.

N'ala, Igbo, ụdara bụ osisi ọmụmụ. Ọ bụ ya mere ụmụnwaanyị dị ime ejighị eji ụdara egwu egwu?

Mbakwa o! Mana akụkọ ụfọọ̄ụ ndị okenye na-ekwu na e nye gị ụdara na nrọ, na ọ pụtara n'akwa nwa gị eruola eluigwe ntị.

Osisi ọjị

Aha onyonyo, Lee ihe omimi ị maghị maka ọjị

Osisi ọjị bụ osisi Igbo na-akwanyere ugwu n'ụzọ pụrụ iche.

Ha na-eji mkpụrụ ya ele ọbịa, ekpe ekpere maọbụ ịgọ ọfọ.

Ogogo Igbo debere ọjị mere na nwaanyị anaghị arị maọbụ ghọọ ọjị ma ya fọdụ ịwa ya awa dịka omenala sị dị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: